Publicidade

Salmos 61

Abụ Ọma nke dịrị onyeisi abụ. Abụ ọma Devid nke eji ụbọ akwara akpọ.

Ekpere nke onye nọ na nsogbu

1 Nụrụ akwa m, O Chineke,

gee ntị nʼekpere m.

2 Ana m akpọku gị site na nsọtụ nke ụwa,

ana m akpọku gị mgbe obi m na-ada mba;

duru m gaa nʼoke nkume ahụ nke karịrị m elu.

3 Nʼihi na bụrịị ebe mgbaba m,

na ụlọ ahụ dịkarịrị elu, sie ike imegide onye iro ahụ.61:3 Ilu 18:10

4 na-agụ m ibi nʼụlọ ikwu gị ruo mgbe ebighị ebi,

ka m gbaba, zere ndụ nʼokpuru nku gị abụọ. Sela

5 Nʼihi na gị onwe gị, Chineke, anụla nkwa niile m kwere;

i nyela m ihe nketa nke ndị na-atụ egwu aha gị.

6 Tụkwasị ọtụtụ ụbọchị na ndụ eze,

mee ka afọ ya ruo ọtụtụ ọgbọ.

7 Kwere ka nọrọ nʼocheeze nʼihu Chineke ruo mgbe ebighị ebi;

zidata ịhụnanya gị na ikwesi ntụkwasị obi gị, ka ha na-echezikwa ya.

8 Mgbe ahụ, aga m abụ abụ otuto nye aha gị, ruo mgbe ebighị ebi.

Aga m emezukwa nkwa m kwere gị ụbọchị niile.

Veja também

Bíblia Online Bíblia Online

Bíblia Online • Versão: 2026-07-05_19-25-13-