Publicidade

Salmos 116

Chineke na-anapụta

1 Ahụrụ m Onyenwe anyị nʼanya, nʼihi na ọ nụrụ olu m;

ọ nụrụ mkpu akwa m maka ebere.

2 Nʼihi na o gere m ntị,

aga m akpọku ya oge ndụ m niile.

3 Agbụ nke ọnwụ kekọrọ m,

oke ihe mgbu nke ili bịakwasịrị m;

nsogbu na iru ụjụ dakwasịrị m.

4 Mgbe ahụ, akpọkuru m aha Onyenwe anyị:

"O Onyenwe anyị, zọpụta m!"

5 Onyenwe anyị bụ onye na-eme ebere na onye ezi omume.

Chineke anyị jupụtakwara nʼọmịiko.

6 Onyenwe anyị na-echebe ndị na-enweghị uche;

mgbe m nọ nʼọnọdụ mkpa, ọ zọpụtara m.

7 Laghachi azụ zuru ike, gị mkpụrụobi m,

nʼihi na Onyenwe anyị emesola gị mmeso ọma.

8 Nʼihi na gị, o Onyenwe anyị, napụtara mkpụrụobi m site nʼọnwụ,

anya m site na anya mmiri akwa,

napụtakwa ụkwụ m site nʼịsọ ngọngọ,

9 ka m nwee ike jegharịa nʼihu Onyenwe anyị

nʼime ala ebe ndị dị ndụ bi.

10 Ekwenyere m na Onyenwe anyị mgbe m kwuru sị,

"Abụ m onye nọ nʼoke nsogbu,"

11 nʼime ịda mba m, ekwuru m sị,

"Mmadụ niile bụ ndị ụgha."

12 Gịnị ka m ga-enyeghachi Onyenwe anyị

nʼihi mmeso ọma niile o mesoro m?

13 Aga m eweli iko nke nzọpụta m elu

kpọkuokwa aha Onyenwe anyị.

14 Nʼihu ndị ya niile ka m ga-anọ

mezuo nkwa m kwere Onyenwe anyị.

15 Ọnwụ nke ndị nsọ ya

dị oke ọnụahịa nʼanya Onyenwe anyị.

16 O Onyenwe anyị, nʼezie, abụ m ohu gị;

abụ m ohu gị, nwa nwoke nke ohu gị nwanyị;

ị zọpụtala m site na agbụ e kere m.

17 Aga m achụrụ gị aja ekele

kpọkuokwa aha Onyenwe anyị.

18 Ọ bụkwa nʼihu ndị ya niile

ka m ga-anọ kwụghachi Onyenwe anyị nkwa m kwere,

19 nʼime ogige ụlọ Onyenwe anyị,

nʼetiti gị, O Jerusalem.

Toonu Onyenwe anyị.

Veja também

Publicidade
Bíblia Online Bíblia Online

Bíblia Online • Versão: 2026-06-16_06-50-08-