Publicidade

Salmos 52

Abụ Ọma nke dịrị onyeisi abụ. Abụ maskil Devid. Nke o bụrụ mgbe Doeg onye Edọm gara gwa Sọl sị, "Devid gara hụ Ahimelek nʼụlọ ya."
Ihe na-eche ndị ajọ omume

1 Gịnị mere i ji na-anya isi nʼihe ọjọọ, gị nwoke dị ike?

Gịnị mere na ogologo ụbọchị niile, ị na-anya isi,

gị onye Chineke na-eleda anya?

2 Ire gị na-atụ atụmatụ ịla nʼiyi;

ọ dị ka agụba dị nkọ,

gị onye na-ebi ndụ aghụghọ.

3 Ị hụrụ ihe ọjọọ nʼanya karịa ihe ọma,

ị hụrụ okwu ụgha nʼanya karịa eziokwu. Sela

4 O onye ire aghụghọ!

Ị hụrụ okwu ọbụla nke na-emegide mmadụ nʼanya.

5 Nʼezie, Chineke ga-akwatu gị ruo mgbe ebighị ebi.

Ọ ga-ejide gị, dọpụta gị site nʼụlọ ikwu gị,

ọ ga-ehopukwa gị site nʼala ndị dị ndụ. Sela

6 Ndị ezi omume ga-ahụ ya tụkwaa egwu;

ha ga-achị ya ọchị na-asị,

7 "Ugbu a, lee nwoke ahụ,

onye jụrụ ime Chineke ebe mgbaba ya.

Ọ tụkwasịrị obi ya na akụnụba ya nke dị ukwuu.

O sitekwara na ibibi ndị ọzọ ghọọ onye dị ike!"

8 Ma adị m ka osisi oliv,

nke na-eto na-awasa nʼụlọnsọ ukwu Chineke.

Ana m atụkwasị obi m nʼịhụnanya Chineke,

nke na-adịgide ruo mgbe niile ebighị ebi.

9 Aga m eto gị ruo mgbe niile ebighị ebi nʼihi ihe i mere;

aga m eto gị nʼihu ndị gị dị nsọ.

Olileanya m ga-adị nʼime aha gị,

nʼihi na aha gị dị mma.

Veja também

Publicidade
Bíblia Online Bíblia Online

Bíblia Online • Versão: 2026-06-15_21-32-39-