Publicidade

Salmos 112

Ụgwọ ọrụ nke onye ezi omume

1 Toonu Onyenwe anyị.

Onye a gọziri agọzi ka nwoke ahụ bụ onye na-atụ egwu Onyenwe anyị;

onye na-enwe oke mmasị idebe iwu ya niile.

2 Ụmụ ya ga-abụ ndị dị ike nʼala ahụ;

ọgbọ ndị na-eme ihe ziri ezi ga-abụ ndị a gọziri agọzi.

3 Akụnụba na-adịgide nʼụlọ ya;

ezi omume ya na-adịgidekwa ruo mgbe ebighị ebi.

4 Ìhè na-enwuru ndị na-eme ihe ziri ezi, ọ bụladị nʼime ọchịchịrị,

nyekwa ndị na-eme amara, ndị obiọma na ndị ezi omume.

5 Ihe ọma ga-abịara onye ahụ na-eme ebere na-ejikwa obi ya agbazinye ndị mmadụ ihe,

onye na-eji ikpe ziri ezi arụ ọrụ ya niile.

6 Nʼezie, agaghị ewezuga ya nʼọnọdụ ya;

a ga-echeta onye ezi omume ruo mgbe ebighị ebi.

7 Ọ gaghị atụ egwu akụkọ ọjọọ;

obi ya na-eguzosi ike, na-atụkwasị Onyenwe anyị obi.

8 Obi ya siri ike, ọ gaghị atụ egwu ihe ọbụla;

nʼikpeazụ, ọ ga-ele ndị na-akpọ ya asị anya na mmeri.

9 Ọ gbasapụrụ aka ya nye ndị ogbenye onyinye dị iche iche,

ezi omume ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi;

a ga-ewere nsọpụrụ welie mpi ya elu.

10 Iwe ga-ewe onye ajọ omume mgbe ọ ga-ahụ ya,

ọ ga-atagide ikikere eze tutu ọ nwụọ;

olileanya niile nke ndị ajọ omume ga-ala nʼiyi.

Veja também

Publicidade
Bíblia Online Bíblia Online

Bíblia Online • Versão: 2026-06-16_18-40-07-