Pular para o conteúdo
Publicidade

Abụ Ọma 6

Abụ Ọma nke dịrị onyeisi abụ. Nke e ji ụbọ akwara abụ. Nʼusoro Sheminit. Abụ Ọma Devid.

Ekpere nʼoge nsogbu

1 O Onyenwe anyị, abarala m mba mgbe na-ewe iwe.

Atala m ahụhụ nʼoge ọnụma gị.

2 Biko, meere m ebere Onyenwe anyị, nʼihi na adịghị m ike.

Gwọọ m, nʼihi na ọkpụkpụ m niile nọ nʼihe mgbu.

3 Mkpụrụobi m nọ nʼọnọdụ ihe mgbu.

Ruo ole mgbe, O Onyenwe anyị, ka ga-anọgide na-agba m nkịtị?

4 Onyenwe anyị, biko, bịa zọpụta m;

nʼihi ịhụnanya gị na-enweghị ọgwụgwụ, napụta m.

5 Nʼetiti ndị nwụrụ anwụ dịghị onye na-ekwupụta aha gị.

O nwere onye na-eto gị site nʼala ili?

6 Ike agwụla m nʼihi ịsụ ude.

Abalị niile, ana m eji ịkwa akwa mee ka ihe ndina m jupụta na mmiri,

ana m eji anya mmiri dee ihe ndina m.

7 Anya m adịghị ahụzikwa ụzọ nke ọma nʼihi ihe mwute;

kaala nka nʼihi mmeso ndị iro m.

8 Sitenụ nʼebe m nọ wezuga onwe unu, unu ndị na-eme ajọ ihe,

nʼihi na Onyenwe anyị anụla akwa m niile.

9 Onyenwe anyị anụla akwa m; nụla arịrịọ nke m na-arịọ ya ka o meere m ebere.

nabatala ekpere m.

10 Ka ndị iro m niile bụrụ ndị ihere ga-eme.

Ha ga-ada mba, bụrụkwa ndị ga-eji ihere laghachi ebe ha si bịa.

Estes versículos te tocaram? Ore agora!

+581 estão orando agora.

Junte-se à corrente de oração.

Veja também