Publicidade

Salmos 6

Abụ Ọma nke dịrị onyeisi abụ. Nke e ji ụbọ akwara abụ. Nʼusoro Sheminit. Abụ Ọma Devid.
Ekpere nʼoge nsogbu

1 O Onyenwe anyị, abarala m mba mgbe ị na-ewe iwe.

Atala m ahụhụ nʼoge ọnụma gị.

2 Biko, meere m ebere Onyenwe anyị, nʼihi na adịghị m ike.

Gwọọ m, nʼihi na ọkpụkpụ m niile nọ nʼihe mgbu.

3 Mkpụrụobi m nọ nʼọnọdụ ihe mgbu.

Ruo ole mgbe, O Onyenwe anyị, ka ị ga-anọgide na-agba m nkịtị?

4 Onyenwe anyị, biko, bịa zọpụta m;

nʼihi ịhụnanya gị na-enweghị ọgwụgwụ, napụta m.

5 Nʼetiti ndị nwụrụ anwụ ọ dịghị onye na-ekwupụta aha gị.

O nwere onye na-eto gị site nʼala ili?

6 Ike agwụla m nʼihi ịsụ ude.

Abalị niile, ana m eji ịkwa akwa mee ka ihe ndina m jupụta na mmiri,

ana m eji anya mmiri dee ihe ndina m.

7 Anya m adịghị ahụzikwa ụzọ nke ọma nʼihi ihe mwute;

ọ kaala nka nʼihi mmeso ndị iro m.

8 Sitenụ nʼebe m nọ wezuga onwe unu, unu ndị na-eme ajọ ihe,

nʼihi na Onyenwe anyị anụla akwa m niile.

9 Onyenwe anyị anụla akwa m; ọ nụla arịrịọ nke m na-arịọ ya ka o meere m ebere.

Ọ nabatala ekpere m.

10 Ka ndị iro m niile bụrụ ndị ihere ga-eme.

Ha ga-ada mba, bụrụkwa ndị ga-eji ihere laghachi ebe ha si bịa.

Veja também

Publicidade
Bíblia Online Bíblia Online

Bíblia Online • Versão: 2026-06-16_18-40-07-