Publicidade

Salmos 140

Abụ nke dịrị onyeisi abụ. Abụ Ọma Devid.
Ekpere maka nchebe

1 O Onyenwe anyị, dọpụta m site nʼaka ndị na-eme ihe ọjọọ.

Chebe m ka m ghara ịdaba nʼaka ndị na-eme ihe ike dị iche iche.

2 Ndị na-atụ atụmatụ ime ihe ọjọọ nʼobi ha

na-akpali agha ụbọchị niile.

3 Ha na-eme ire ha ka ha dị nkọ dịka nke agwọ;

elo ajụala dị nʼegbugbere ọnụ ha. Sela

4 Chebe m Onyenwe anyị, ka m ghara ịdaba nʼaka ndị na-emebi iwu;

chebe m ka m ghara ịdaba nʼaka ndị na-eme ihe ike,

ndị na-eche echiche ọdịda m.

5 Ndị mpako esielera m ọnya igbudu;

ha agbasaala ụgbụ ha na udo ha,

siekwara m ọnya dị iche iche nʼụzọ m na-aga. Sela

6 A sịrị m Onyenwe anyị, "Gị onwe gị bụ Chineke m."

Nụrụ, O Onyenwe anyị, olu arịrịọ m maka amara.

7 Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị Onye nzọpụta m dị ike,

ị na-ekpuchi isi m nʼụbọchị agha.

8 Ekwekwala ka ndị ajọ omume chọta ihe ha na-achọ, o Onyenwe anyị,

ekwekwala ka nzube ha mezuo. Sela

9 Ndị niile gbara m gburugburu na-ebuli isi ha elu na nganga

ka ndụ ọjọọ nke egbugbere ọnụ ha rikpuo ha.

10 Ka icheku ọkụ na-ere ere dakwasị ha;

ka a tụba ha nʼime ọkụ na-ere ere,

nʼime olulu apịtị jupụtara, nke ha na-enweghị ike isite nʼime ya pụta ọzọ.

11 Ekwela ka ndị na-ekwu okwu nkwulu guzosie ike nʼala,

ka ihe ọjọọ chụda ndị na-eme ihe ike.

12 Amaara m na Onyenwe anyị ga-ekpe ikpe ziri ezi nye ndị ogbenye

na-emekwa ka ndị nọ na mkpa nweta ihe ruuru ha.

13 Nʼezie, ndị ezi omume ga-eto aha gị,

ndị ziri ezi ga-ebikwa nʼihu gị.

Veja também

Publicidade
Bíblia Online Bíblia Online

Bíblia Online • Versão: 2026-06-16_06-50-08-