Publicidade

Salmos 80

Abụ Ọma nke dịrị onyeisi Abụ. Ọ bụ olu abụ eji ekwe "Okoko lili nke Ọgbụgba Ndụ" Abụ Ọma nke Asaf.
Ekpere maka nnapụta

1 Nụrụ olu anyị, O Onye ọzụzụ atụrụ nke Izrel,

gị onye na-edu Josef dịka igwe atụrụ.

Gị onye na-anọdụ dịka eze, nʼetiti cherubim,

nwupụta Ìhè 2 nʼihu Ifrem, Benjamin na Manase.

Kpọtee ịdị ike gị,

bịa zọpụta anyị.

3 O Chineke, kpọghachi anyị azụ,

mee ka ihu gị nwukwasị anyị,

ka e nwee ike ịzọpụta anyị.

4 O Onyenwe anyị, Chineke, Onye pụrụ ime ihe niile

ruo ole mgbe ka iwe gị ga-adị ọkụ

megide ekpere ndị gị?

5 I jirila anya mmiri dịka a ga-asị na ọ bụ achịcha zụọ ha nri;

i meela ka ha ṅụọ anya mmiri nʼihe ọtụtụ.

6 I meela ka anyị bụrụ ihe na-eweta esemokwu nʼetiti ndị agbataobi anyị,

ndị iro anyị na-achịkwa anyị ọchị.

7 O Chineke, Onye pụrụ ime ihe niile, kpọghachi anyị azụ,

mee ka ihu gị nwukwasị anyị,

ka e nwee ike ịzọpụta anyị.

8 I sitere nʼala Ijipt wepụta osisi vaịnị;

ị chụpụrụ mba ndị ọzọ, kụọ ya.

9 Ị sụchaara ya ala,

mgbọrọgwụ ya bara nʼime ala nke ọma, o jupụtakwara ala ahụ niile.

10 Ndo ya kpuchiri ugwu niile,

alaka ya gbasara kpuchie osisi sida ukwu sida.

11 Ọ wasaala alaka ya ruo oke osimiri

wasaakwa ume ya ruo osimiri.

12 Gịnị mere i ji tiwasịa mgbidi ya niile

si otu a mee ka ndị niile na-agafe ghọrọ mkpụrụ ya?

13 Oke ezi si nʼoke ọhịa na-emebisi ya,

ụmụ ahụhụ si nʼọhịa dị iche iche na-ejikwa ya emere ihe oriri.

14 Lọghachikwute anyị, O Chineke, Onye pụrụ ime ihe niile.

Si nʼeluigwe ledata anya ma hụ!

Letakwa osisi vaịnị a,

15 mgbọrọgwụ nke aka nri gị kụrụ,

ọkpara nke ị zụlitere nye onwe gị.

16 E gbutuola osisi vaịnị gị, e ji ọkụ repịa ya;

mgbe ị bara mba, ndị gị na-ala nʼiyi.

17 Ka aka gị dịkwasị nwoke ahụ nọ nʼaka nri gị,

nwa nke mmadụ onye ị zụlitere nye onwe gị.

18 Mgbe ahụ, anyị agaghị esikwa nʼebe ị nọ laghachi azụ;

tutee anyị, anyị ga-akpọkukwa aha gị.

19 Kpọghachi anyị azụ, O Onyenwe anyị, Chineke, Onye pụrụ ime ihe niile

mee ka ihu gị nwukwasị anyị,

ka e nwee ike zọpụta anyị.

Veja também

Publicidade
Bíblia Online Bíblia Online

Bíblia Online • Versão: 2026-06-16_18-40-07-