Publicidade

Salmos 3

Abụ Ọma Devid. Nke o dere mgbe o si nʼihu Absalọm gbapụ ọsọ ndụ.
Ekpere maka enyemaka

1 O Onyenwe anyị, ọnụọgụgụ ndị iro m dị ọtụtụ.

Ọtụtụ ndị mmadụ na-ebili imegide m.

2 Ọtụtụ nʼime ha na-ekwu banyere m sị,

"Chineke agaghị azọpụta ya." Sela

3 Ma gị, Onyenwe anyị bụ ọta na-ekpuchi m;

I na-ebuli isi m elu na-eme ka m bụrụ onye nwere nsọpụrụ.

4 Etikuru m Onyenwe anyị mkpu akwa,

ọ nụkwara olu m, sitekwa nʼugwu nsọ ya za m. Sela

5 Edinara m ala, hie ụra,

ma bilikwa nʼụtụtụ nʼudo, nʼihi na Onyenwe anyị na-eche m nche.

6 A sịkwa na iri puku kwụrụ puku ndị iro agbaa m gburugburu,

agaghị m atụ egwu ọbụla.

7 Bilie Onyenwe anyị!

Zọpụta m Chineke m!

Tie ndị iro m niile aka nʼagba;

tipụkwa ndị ajọ omume eze nʼọnụ.

8 Nʼihi na nzọpụta na-esite nʼebe Onyenwe anyị nọ na-abịa.

Ka ngọzị gị dịịrị ndị gị niile. Sela

Veja também

Publicidade
Bíblia Online Bíblia Online

Bíblia Online • Versão: 2026-06-15_21-32-39-