Publicidade

Salmos 94

Chineke, onye ikpe nke mmadụ niile

1 O Onyenwe anyị, Chineke onye na-abọ ọbọ,

o Chineke, onye na-abọ ọbọ, zipụta onwe gị.

2 Bilie, o Onye Ikpe nke ụwa;

kwụghachi ndị nganga ụgwọ ọrụ ruuru ha.

3 Onyenwe anyị, ọ bụ ruo ole mgbe?

Ọ bụ ruo ole mgbe ka ndị na-eme ajọ omume ga-anọgide na-aṅụrị ọṅụ?

4 Ha na-ekwuwapụ okwu mpako;

ndị niile na-eme ajọ ihe jupụtara nʼitu ọnụ.

5 Ha na-azọpịa ndị gị, O Onyenwe anyị;

ha na-emegbu ihe nketa gị.

6 Ha na-egbu ndị di ha nwụrụ na ndị ọbịa;

ha na-egbu ndị na-enweghị nna.

7 Ha na-asị, "Onyenwe anyị anaghị ahụ ihe ndị a;

Chineke Jekọb na-agba nkịtị."

8 Lezienụ anya, unu ndị amamihe kọrọ nʼetiti ndị m;

unu ndị nzuzu, olee mgbe unu ga-amụta ihe?

9 Ọ pụtara na onye kpụrụ ntị anaghị anụ ihe?

Ọ pụtara na onye kere anya anaghị ahụ ụzọ?

10 Ọ pụtara na onye na-adọ mba niile aka na ntị agaghị ata ha ahụhụ?

Ọ pụtara na onye na-ezi mmadụ ihe enweghị ihe ọmụma?

11 Onyenwe anyị maara echiche obi mmadụ;

ọ maara na ihe mmadụ na-eche nʼobi ya bụ naanị ihe na-enweghị isi.

12 Onye a gọziri agọzi ka mmadụ ahụ bụ, onye ị na-adọ aka na ntị, O Onyenwe anyị,

onye ahụ ị na-akụziri ihe site nʼiwu gị;

13 ị na-enye ya izuike site nʼụbọchị nsogbu;

tutu ruo mgbe a ga-egwuru ndị ajọ omume olulu.

14 Nʼihi na Onyenwe anyị agaghị ajụ ndị ya;

ọ gaghị agbakụta ihe nketa ya azụ.

15 Ezi omume ga-abụ ntọala ikpe ikpe niile;

ndị niile ndị ziri ezi nʼobi ga-agbasokwa ya.

16 Onye ga-ebiliri m imegide ndị ajọ omume?

Onye ga-eguzo nʼọnọdụ m imegide ndị na-eme ajọ ihe?

17 A sị na Onyenwe anyị abịaghị nyere m aka,

agaara m rịị abụ onye nwụrụ anwụ.

18 Mgbe m kwuru sị, "Ụkwụ m na-agbuchapụ,"

ọ bụ ịhụnanya gị, O Onyenwe anyị, kwagidere m.

19 Mgbe oke nchekasị obi batara nʼime m,

nkasiobi gị wetara mkpụrụobi m ọṅụ.

20 A ga-ejikọta gị na ocheeze ọchịchị ya rụrụ arụ,

nke na-eweta mmekpa ahụ site nʼiwu ya?

21 Ndị ajọ omume na-ejikọta onwe ha imegide ndị ezi omume

na-amakwa ndị aka ha dị ọcha ikpe ọnwụ.

22 Ma Onyenwe anyị a bụrụla ebe mgbaba e wusiri ike nye m,

na Chineke m na oke nkume ebe m na-ezere ndụ.

23 Ọ ga-akwụghachi ha ụgwọ ọrụ kwesiri mmehie ha,

lakwaa ha nʼiyi nʼihi ajọ omume ha;

Onyenwe anyị Chineke anyị ga-ala ha nʼiyi.

Veja também

Publicidade
Bíblia Online Bíblia Online

Bíblia Online • Versão: 2026-06-16_18-40-07-