Publicidade

Salmos 23

Abụ Ọma Devid.
Onyenwe anyị na-azụ anyị dị ka atụrụ

1 Onyenwe anyị na-azụ m dịka atụrụ, ọ dịghị ihe akọrọ m.

2 Ọ na-eme ka m dinaa ala nʼebe ahịhịa ndụ na-eto,

ọ na-edugharị m nʼakụkụ mmiri dị jụụ,

3 ọ na-atụte mkpụrụobi m.

Ọ na-edu m nʼụzọ niile nke ezi omume

nʼihi aha ya.

4 A sịkwarị na m na-aga ije,

na ndagwurugwu nke ọchịchịrị ọnwụ,

agaghị m atụ egwu ihe ọjọọ ọbụla;

nʼihi na ị nọnyeere m,

mkpọrọ gị na mkpanaka gị

na-akasị m obi.

5 Ị na-akwado tebul nʼihu m,

nʼanya ndị iro m.

I tere isi m mmanụ Ndị ọzụzụ atụrụ na-ejikwa ya achụ ụmụ ahụhụ na ndanda na-achọ ịrịbanye atụrụ ndị ha na-azụ nʼimi.

iko m na-ejubiga oke.

6 Nʼezie, ịdị mma na ebere ga-agbaso m

ogologo ụbọchị niile nke ndụ m,

m ga-ebikwa nʼụlọ Onyenwe anyị

mgbe niile ebighị ebi.

Veja também

Publicidade
Bíblia Online Bíblia Online

Bíblia Online • Versão: 2026-06-16_18-40-07-