Publicidade

Salmos 77

Abụ Ọma nke dịrị onyeisi abụ. Maka Jedutun. Abụ nke Asaf. Abụ Ọma.
Nkasiobi nʼoge nsogbu

1 Etikuru m Chineke nʼoke olu maka enyemaka;

etikuru m Chineke mkpu ka ọ nụrụ olu m.

2 Mgbe m nọ nʼihe mgbu, ọ bụ Onyenwe anyị ka m chọrọ.

Nʼanyasị, esetipụrụ m aka m abụọ, ike na-agwụghị,

mmụọ m jụkwara ka a akasịe ya obi.

3 O Chineke, echetara m gị, sụkwaa ude;

echere m echiche, mkpụrụobi m dakwara mba. Sela

4 I kweghị ka anya m abụọ mechie;

nʼihi oke mwute m, enweghị m ike kwuo okwu.

5 Echere m echiche banyere ụbọchị niile gara aga,

na afọ niile ndị gara aga.

6 Echetara m abụ niile m na-abụ nʼime anyasị.

Mkpụrụobi m nọ nʼọnọdụ ntụgharị uche, mmụọ m jụkwara ajụjụ.

7 "Onyenwe anyị ọ ga-agbakụta m azụ ruo mgbe ebighị ebi?

Ọ pụtara na ọ gaghị egosi ihuọma ya ọzọ?

8 Ọ pụtara na ịhụnanya ya nke na-adịgide ruo ebighị ebi agwụla?

Ọ pụtara na nkwa ya agaghị emezu ruo ebighị ebi?

9 Chineke, o chefuola i mere anyị ebere?

O jichiela ọmịiko ya nʼihi iwe?" Sela

10 Mgbe ahụ, ekwuru m, "Lee ọnọdụ ọjọọ m,

afọ niile mgbe Onye kachasị ihe niile elu setịpụrụ aka nri ya.

11 Aga m echeta ọrụ niile Onyenwe anyị rụrụ;

e, aga m echeta ihe ịrịbama niile i mere nʼoge gara aga.

12 Aga m atụgharịa uche m nʼọrụ gị niile,

tuleekwa ọrụ ukwuu gị niile dị iche iche."

13 O Chineke, ụzọ gị niile dị nsọ.

Olee chi dị ukwuu dịka Chineke anyị?

14 Ị bụ Chineke onye na-arụ ọrụ ebube dị iche iche;

ị na-egosipụta ike gị nʼetiti ụmụ mmadụ.

15 I ji aka gị dị ike gbapụta ndị gị,

bụ ụmụ ụmụ Jekọb na Josef. Sela

16 Osimiri hụrụ gị, O Chineke,

osimiri hụrụ gị, taa;

ogbu mmiri mere mkpọtụ.

17 Igwe ojii wụpụrụ mmiri,

mkpọtụ egbe eluigwe jupụtara mbara eluigwe;

àkụ gị gburu amụma ebe niile.

18 A nụrụ ụda egbe eluigwe gị nʼoke ifufe,

amụma gị nyere ụwa niile ihe;

elu ụwa niile mara jijiji, tụkwaa oke egwu.

19 Ọ bụ nʼosimiri ka nzọ ụkwụ gị gara,

ụzọ gị gara nʼetiti oke osimiri,

ọ bụ ezie na ahụghị m nzọ ụkwụ gị anya.

20 I sitere nʼaka Mosis na Erọn

duo ndị gị dịka igwe atụrụ.

Veja também

Publicidade
Bíblia Online Bíblia Online

Bíblia Online • Versão: 2026-06-16_18-40-07-