Publicidade

Salmos 60

Abụ Ọma nke dịrị onyeisi Abụ. Ọ bụ olu abụ eji ekwe "Okoko lili nke Ọgbụgba Ndụ." Abụ miktam nke Devid maka izi ihe. Mgbe ọ lụsoro Aram Naharaim na Aram Zoba ọgụ, nakwa mgbe Joab lọghachitara, tigbuo narị ndị Edọm iri nʼabụọ na Ndagwurugwu Nnu.
Ekpere maka nnapụta

1 O Chineke, ị jụla anyị, ị tịwawo anyị nʼike;

i wesola anyị iwe, ugbu a, kpọghachi anyị.

2 I meela ka ala a maa jijiji, ị dọwakwala ya;

mezie ntiwa ya niile, nʼihi na ọ na-ama jijiji.

3 I meela ka ndị gị gabiga ọnọdụ ihe isi ike;

i nyela anyị mmanya nke mere ka anyị na-adagharị.

4 Ma nye ndị na-atụ egwu gị, i weliela otu ọkọlọtọ

nke a ga-agbasa nʼihi eziokwu imegide ụta nke ndị iro. Sela

5 Were aka nri gị zọpụta anyị ma nyere anyị aka,

ka a gbapụta ndị ị hụrụ nʼanya.

6 Chineke esitela nʼịdị nsọ ya kwuo, sị,

"Nʼọnọdụ ọṅụ nke mmeri, aga m ekesa Shekem,

tụkwaa Ndagwurugwu Sukọt nʼihe ọtụtụ nyepụ ya.

7 Gilead bụ nke m, otu a kwa, Manase bụkwa nke m;

Ifrem bụ okpu igwe m,

Juda bụ mkpara eze m.

8 Moab bụ efere ịkwọ aka m,

aga m atụsa akpụkpọụkwụ m nʼelu Edọm;

nʼelu isi Filistia, ana m eti mkpu mmeri."

9 Onye ga-akpọrọ m gaa nʼobodo e wusiri ike?

Onye ga-edu m gaa Edọm?

10 Ọ bụghị gị, O Chineke? Gị onye jụrụ anyị,

onye na-adịghị esokwa ndị agha anyị aga agha?

11 Nyere anyị aka ka anyị pụọ nʼaka ndị iro,

nʼihi na inyeaka mmadụ bụ ihe efu.

12 Site na Chineke, anyị ga-enwe mmeri,

ọ ga-azọpịa ndị iro anyị niile nʼala.

Veja também

Publicidade
Bíblia Online Bíblia Online

Bíblia Online • Versão: 2026-06-16_18-40-07-