Pular para o conteúdo
Publicidade

Abụ Ọma 60

Abụ Ọma nke dịrị onyeisi Abụ. bụ olu abụ eji ekwe "Okoko lili nke Ọgbụgba Ndụ." Abụ miktam nke Devid maka izi ihe. Mgbe lụsoro Aram Naharaim na Aram Zoba ọgụ, nakwa mgbe Joab lọghachitara, tigbuo narị ndị Edọm iri nʼabụọ na Ndagwurugwu Nnu.

Ekpere maka nnapụta

1 O Chineke, jụla anyị, tịwawo anyị nʼike;

i wesola anyị iwe, ugbu a, kpọghachi anyị.

2 I meela ka ala a maa jijiji, dọwakwala ya;

mezie ntiwa ya niile, nʼihi na na-ama jijiji.

3 I meela ka ndị gị gabiga ọnọdụ ihe isi ike;

i nyela anyị mmanya nke mere ka anyị na-adagharị.

4 Ma nye ndị na-atụ egwu gị, i weliela otu ọkọlọtọ

nke a ga-agbasa nʼihi eziokwu imegide ụta nke ndị iro. Sela

5 Were aka nri gị zọpụta anyị ma nyere anyị aka,

ka a gbapụta ndị hụrụ nʼanya.

6 Chineke esitela nʼịdị nsọ ya kwuo, sị,

"Nʼọnọdụ ọṅụ nke mmeri, aga m ekesa Shekem,60:6 Shekem bụ isi obodo ọchịchị mbụ ndị Izrel. Jen 12:6

tụkwaa Ndagwurugwu Sukọt nʼihe ọtụtụ nyepụ ya.

7 Gilead bụ nke m,60:7 Gilead, bụ ala ndị dị nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ obodo ahụ. Jos 13:24-32 otu a kwa, Manase bụkwa nke m;60:7 Manase, bụkwa ala ndị dị nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ obodo ahụ. Jos 13:24-32

Ifrem bụ okpu igwe m,

Juda bụ mkpara eze m.

8 Moab bụ efere ịkwọ aka m,

aga m atụsa akpụkpọụkwụ m nʼelu Edọm;

nʼelu isi Filistia, ana m eti mkpu mmeri."

9 Onye ga-akpọrọ m gaa nʼobodo e wusiri ike?

Onye ga-edu m gaa Edọm?

10 bụghị gị, O Chineke? Gị onye jụrụ anyị,

onye na-adịghị esokwa ndị agha anyị aga agha?

11 Nyere anyị aka ka anyị pụọ nʼaka ndị iro,

nʼihi na inyeaka mmadụ bụ ihe efu.

12 Site na Chineke, anyị ga-enwe mmeri,

ga-azọpịa ndị iro anyị niile nʼala.

Estes versículos te tocaram? Ore agora!

+581 estão orando agora.

Junte-se à corrente de oração.

Veja também