Publicidade

Salmos 66

Abụ dịrị onyeisi abụ. Otu Abụ. Abụ Ọma.
Abụ ekele

1 Ụwa niile, jirinụ ọṅụ tikuo Chineke!

2 Bụọ abụ banyere ebube aha ya;

meenụ ka otuto ya bụrụ ihe dị ebube!

3 Gwa Chineke okwu sị ya, "Lee ka ọrụ gị niile si dị oke egwu!

Ike gị dị nnọọ ukwu,

ya mere ndị iro gị, na-ada nʼihu gị nʼihi ụjọ.

4 Ndị niile bi nʼụwa na-akpọ isiala nye gị;

ha na-abụku gị abụ otuto,

ha na-abụ abụ otuto nye aha gị." Sela

5 Bịa lee ihe Chineke mere,

ụdị ọrụ oke egwu ọ na-arụ nʼihi mmadụ!

6 O mere ka osimiri ghọọ ala akọrọ,

ha ji ụkwụ si nʼetiti osimiri gafee;

bịanụ ka anyị ṅụrịa nʼime ya.

7 Ọ na-achị ruo mgbe ebighị ebi site nʼike ya,

anya ya na-elekwa mba niile,

ka ndị nnupu isi ghara ịfụlị onwe ha elu megide ya. Sela

8 Toonu Chineke anyị, unu mmadụ niile,

kwere ka a nụ ụda otuto ya;

9 O chebela ndụ anyị,

ma mee ka ụkwụ anyị ghara ịmịchapụ.

10 Nʼihi na ọ bụ gị, O Chineke, nwara anyị;

ị nụchara anyị dịka ọlaọcha.

11 Ị kpọbatara anyị nʼụlọ mkpọrọ,

ma bokwasị ibu dị arọ nʼazụ anyị.

12 I kwere ka ndị mmadụ rịa anyị elu;

anyị esitela nʼime ọkụ na nʼime mmiri gafee.

Ị kpọbatala anyị ebe anyị nwezuru ihe niile.

13 Aga m e ji aja nsure ọkụ bata nʼime ụlọnsọ ukwu gị,

imezu nkwa m kwere gị

14 nʼihi na nke a bụ ihe m ji ọnụ m kwuo,

ọ bụkwa nke a ka egbugbere ọnụ m kwupụtara na m ga-eme nʼoge nsogbu m.

15 Aga m eji anụ ndị gbara abụba chụọrọ gị aja,

ya na aja onyinye nke ọtụtụ ebule;

Aga m achụkwa aja onyinye nke ọtụtụ oke ehi na mkpi. Sela

16 Bịanụ nụrụ, unu niile na-atụ egwu Chineke;

ka m kọọrọ unu ihe o meere m.

17 Eji m ọnụ m kpọkuo ya;

otuto ya dị m nʼire.

18 Ọ bụrụ na mmehie na-amasị m nʼime obi m,

Onyenwe anyị agaraghị ege m ntị;

19 ma Chineke gere ntị nʼezie,

nụrụkwa olu arịrịọ m.

20 Otuto dịrị Chineke,

onye na-ajụghị ekpere m

maọbụ ghara izi m ịhụnanya ya!

Veja também

Publicidade
Bíblia Online Bíblia Online

Bíblia Online • Versão: 2026-06-16_18-40-07-