Publicidade

Salmos 46

Abụ Ọma nke dịrị onyeisi abụ. Abụ ụmụ Kora. Nʼusoro olu abụ alamot. Otu Abụ.
Chineke bụ ebe mgbaba anyị

1 Chineke bụ ebe mgbaba anyị, na ike anyị,

onye inyeaka anyị ka ọ bụ nʼoge nsogbu.

2 Nʼihi ya, anyị agaghị atụ egwu, ọ bụladị mgbe ụwa niile na-emebi,

maọbụ mgbe a na-ewezuga ugwu nʼọnọdụ ha, mee ka ha daba nʼoke osimiri.

3 Nʼagbanyeghị na mmiri ya na-agba aghara, na-asụkwa ụfụfụ,

maọbụ na ugwu niile na-eme mkpọtụ site nʼoke mbili elu ha. Sela

4 Otu iyi dị nke na-asọbata na-eweta ọṅụ nʼime obodo Chineke,

nʼime ebe obibi dị nsọ nke Onye kachasị ihe niile elu.

5 Chineke bi nʼime ya, ọ gaghị ada;

Chineke ga-enyere ya aka mgbe chi bọrọ.

6 Mba niile na-agba aghara, alaeze niile na-adakwa;

o welitere olu ya elu, ụwa na-agbaze.

7 Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile nọnyere anyị;

Chineke nke Jekọb bụ ebe mgbaba anyị e wusiri ike. Sela

8 Bịa, hụrụ ihe ebube niile Onyenwe anyị mere,

lee oke ịla nʼiyi niile o webatara nʼelu ụwa.

9 Ọ na-eme ka agha kwụsị

ruo nsọtụ nke elu ụwa niile.

Ọ na-agbaji ụta, na-ebibi ùbe,

ma na-esu ọta agha niile ọkụ.

10 Ọ na-asị, "Nọọnụ juu! Maranụ na mụ onwe m bụ Chineke!

A ga-ebuli m elu nʼetiti mba niile,

a ga-ebulikwa m elu nʼụwa."

11 Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile nọnyere anyị;

Chineke nke Jekọb bụ ebe mgbaba anyị e wusiri ike. Sela

Veja também

Publicidade
Bíblia Online Bíblia Online

Bíblia Online • Versão: 2026-06-16_18-40-07-