Publicidade

Salmos 113

Abụ otuto

1 Toonu Onyenwe anyị!

Toonu Onyenwe anyị unu ndị ohu ya.

Toonu aha Onyenwe anyị.

2 Ka aha Onyenwe anyị bụrụ ihe a gọziri agọzi

site ugbu a ruo mgbe ebighị ebi.

3 Site nʼọwụwa anyanwụ ruo nʼọdịda ya,

aha Onyenwe anyị ga-abụ ihe a na-eto eto.

4 Onyenwe anyị dị elu karịa mba niile,

ebube ya dị elu karịa eluigwe.

5 Onye dị ka Onyenwe anyị Chineke anyị,

onye nọkwasịrị ocheeze nʼebe dị elu,

6 onye na-eme onwe ya ka ọ dị ala ilekwasị

eluigwe na ụwa anya?

7 Ọ na-esi nʼuzuzu bulie ogbenye elu

sitekwa nʼebe ikpofu ahịhịa bulie onye nọ na mkpa elu;

8 ọ na-eme ka ya na ụmụ eze ndị ikom nọkọọ,

ọ na-eme ka o soro ndị a maara aha ha nʼetiti ụmụ mmadụ nọkọọ.

9 Ọ na-eme ka nwanyị aga biri nʼụlọ nke ya

dịka nne mụrụ ọtụtụ ụmụ ọṅụ juru obi.

Toonu Onyenwe anyị.

Veja também

Publicidade
Bíblia Online Bíblia Online

Bíblia Online • Versão: 2026-06-16_06-50-08-