Publicidade

Salmos 121

Abụ nrigo.
Inyeaka si nʼebe Onyenwe anyị nọ

1 Aga m eweli anya m abụọ elu, lee ha nʼelu ugwu niile,

olee ebe inyeaka ga-esi bịara m?

2 Inyeaka m na-esite nʼaka Onyenwe anyị,

onye kere eluigwe na ụwa bịa.

3 Ọ gaghị ekwe ka ụkwụ gị gbụchapụ,

onye na-eche gị nche na-amụ anya oge niile;

4 nʼezie onye na-eche Izrel nche

adịghị arahụ ụra, ọ dịghị atụkwa oru ụra.

5 Onyenwe anyị na-eche gị nche,

Onyenwe anyị bụ ndo gị nʼaka nri gị;

6 anyanwụ agaghị achagbu gị nʼehihie,

ọnwa agaghị etigbukwa gị nʼabalị.

7 Onyenwe anyị ga-edebe gị ka ihe ọjọọ ọbụla ghara ịdakwasị gị.

Ọ ga na-eche ndụ gị nche mgbe niile.

8 Onyenwe anyị ga-echebe gị mgbe ị na-apụ na mgbe ị na-abata abata,

site ugbu a ruo mgbe niile ebighị ebi.

Veja também

Publicidade
Bíblia Online Bíblia Online

Bíblia Online • Versão: 2026-06-16_06-50-08-