Publicidade

Salmos 62

Abụ Ọma nke dịrị onyeisi abụ. Maka Jedutun. Abụ Ọma Devid.
Ịnọgide nʼokwukwe

1 Ọ bụ naanị nʼime Chineke ka mkpụrụobi m na-achọta izuike.

Nzọpụta m na-esite na ya na-abịa.

2 Naanị ya bụ oke nkume m na nzọpụta m;

ọ bụ ebe mgbaba m e wusiri ike, agaghị m ama jijiji nʼọnọdụ m.

3 Ruo ole mgbe ka unu ga-anọgide na-ebuso agha megide nwoke a?

Unu niile, unu chọrọ ịkwatu ya,

ebe ọ bụ naanị mgbidi na-ada ada, mgbidi na-esighị ike e ji osisi wuo?

4 Ha ekpebiela

isite nʼọnọdụ ya dị elu kwatuo ya;

okwu ụgha na-atọ ha ụtọ.

Ha na-eji ọnụ ha na-agọzi,

ma nʼime obi ha, ha na-abụ ọnụ. Sela

5 O mkpụrụobi m, chọta ezumike naanị nʼime Chineke;

olileanya m na-esite na ya na-abịa.

6 Naanị ya bụ oke nkume m, na onye nzọpụta m.

Naanị ya kwa bụ ebe mgbaba m e wusiri ike, agaghị m ama jijiji nʼọnọdụ m.

7 Nzọpụta m na nsọpụrụ m dabeere na Chineke,

Ọ bụ oke nkume m, ebe mgbaba m.

8 Tụkwasịnụ ya obi mgbe niile, unu ndị mmadụ;

kwupụtaranụ ya obi unu,

nʼihi na Chineke bụ ebe mgbaba anyị. Sela

9 Ndị nta nʼetiti ụmụ mmadụ bụ naanị otu nkuume,

ndị ukwu bụ naanị ụgha;

ọ bụrụ na a tụọ ha nʼihe ọtụtụ, ha bụ ihe efu;

ha niile bụ naanị otu nkuume.

10 Unu atụkwasịla obi unu nʼiji aka ike kpata ego,

maọbụ tụkwasị olileanya unu nʼihe e zuru ezu;

akụ unu nwere ike mụbaa,

unu atụkwasịla ha obi.

11 Chineke ekwuola otu ihe,

ihe abụọ ka m nụrụ:

"Na gị, O Chineke, dị ike,

12 na gị, Onyenwe anyị, jupụtara nʼịhụnanya.

Nʼezie, ị ga-akwụghachi onye ọbụla

dịka ọrụ ya si dị."

Veja também

Publicidade
Bíblia Online Bíblia Online

Bíblia Online • Versão: 2026-06-16_18-40-07-