Pular para o conteúdo
Publicidade

Abụ Ọma 83

Abụ, bụ Abụ Ọma Asaf.

Ekpere maka mmeri

1 O! Chineke agbachikwala nkịtị.

Biko, Chineke, ahapụkwala ikwu okwu,

anọkwala jụụ.

2 Lee na ndị iro gị nọ na-ebigbọ,

ndị kpọrọ gị asị na-eweli isi ha.

3 Ha ji aghụghọ na-agba izu imegide ndị gị;

ha na-atụ atụmatụ ọjọọ megide ndị ị hụrụ nʼanya.

4 Ha na-asị, "Bịanụ ka anyị laa mba a nʼiyi,

ka a ghara ichetakwa aha Izrel ọzọ."

5 Ha ji otu obi na-agbarịta izu;

ha agbaala ndụ imegide gị,

6 ụlọ ikwu niile nke ndị Edọm, na ndị Ishmel,

na ndị Moab, na ndị Haga,

7 na ndị Gebal, na ndị Amọn, na ndị Amalek,

na ndị Filistia, ha na ndị Taịa.

8 Ọ bụladị ndị Asịrịa esorokwala ha,

ịgba ndị agbụrụ Lọt ume. Sela

9 Mee ha dịka i si mee ndị Midia,

na dịka i mere Sisera na Jabin,83:9 Eze Jabin na nwa ya Sisera, bụ ndị Debọra meriri nʼagha nʼugwu Taboa. Nkp 4:15-24; 5:20-21. nʼakụkụ iyi Kishọn,

10 ndị lara nʼiyi nʼEndoa

ma ghọọ ihe dịka nsị anụ e kpofuru ekpofu nʼala.

11 Mee ka ndị ọgaranya ha dịka Oreb na Zeeb,83:11 Ha bụ ndị eze, bụrụkwa ndị ọchịagha ndị Midia. Ha so na ndị Gidiọn meriri nʼagha, Nkp 7:25

ka ụmụ ndị ikom eze ha niile dịka Zeba na Zalmuna,

12 ndị sịrị, "Ka anyị nwetara onwe anyị,

ebe ịta nri ụmụ anụmanụ niile nke Chineke."

13 O Chineke m, mee ha ka dịka ahịhịa ifufe na-efegharị gburugburu,

maọbụ dịka igbugbo ọka nʼebe ifufe dị.

14 Dịka ọkụ na-erepịa oke ọhịa,

maọbụ nke na-ere nʼelu ugwu,

15 si otu a were oke ifufe chụọ ha ọsọ,

jiri oke ifufe nke na-eso mmiri ozuzo mee ka ha nọrọ nʼọnọdụ obi ọlụlọ mmiri.

16 Were ihere kpuchie ha ihu,

ka ndị mmadụ si otu a chọọ aha gị, O Onyenwe anyị.

17 Ka ha nọdụ nʼọnọdụ ihere na ịda mba mgbe niile;

ka ha laa nʼiyi nʼọnọdụ mweda nʼala.

18 Mee ka ha mata na gị, onye aha ya bụ Onyenwe anyị,

na ọ bụ naanị gị bụ Onye kachasị ihe niile elu nʼụwa niile.

Estes versículos te tocaram? Ore agora!

+581 estão orando agora.

Junte-se à corrente de oração.