Publicidade

Salmos 70

Abụ Ọma dịrị onyeisi abụ. Nke Devid. Arịrịọ.
Ekpere maka nnapụta

1 O Chineke, gbata ọsọ bịa zọpụta m,

O Onyenwe anyị, bịa ngwangwa inyere m aka.

2 Ka ndị niile na-achọ ịnapụ m ndụ m,

bụrụ ndị a ga-etinye nʼọnọdụ ihere na ọgbaaghara.

Ka ndị ọ na-amasị ịhụ ịla nʼiyi m

laghachi azụ nʼihere.

3 Ka ndị ahụ na-asị m, "Ehee! Ehee!"

laghachi azụ nʼihi ihere ha.

4 Ma ka ndị niile na-achọ gị

ṅụrịa ọṅụ, nweekwa obi ụtọ nʼime gị,

ka ndị ahụ hụrụ nzọpụta gị nʼanya na-ekwu mgbe niile,

"Onyenwe anyị dị ukwuu."

5 Ma mụ onwe m bụ ogbenye na onye nọ na mkpa;

O Chineke, mee ngwangwa bịakwute m.

Ị bụ onye inyeaka m na onye mgbapụta m;

O Onyenwe anyị, anọla ọdụ ịbịa.

Veja também

Publicidade
Bíblia Online Bíblia Online

Bíblia Online • Versão: 2026-06-16_18-40-07-