Publicidade

Salmos 109

Abụ Ọma nke dịrị onyeisi Abụ. Abụ Ọma Devid.
Ntamu nʼoge nsogbu

1 O Chineke, onye m na-eto,

anọgidekwala na-agba nkịtị,

2 nʼihi na ndị ajọ omume na ndị aghụghọ

emegheela ọnụ ha megide m;

ha aghaala ụgha megide m.

3 Ha na-eji okwu ịkpọ asị gbaa m gburugburu;

na-ebuso m agha nʼefu.

4 Nʼọnọdụ ịhụnanya m hụrụ ha, ha na-ebo m ebubo

ma abụ m nwoke onye ekpere.

5 Ha ji ihe ọjọọ na-akwụ m ụgwọ ihe ọma m mere,

ịkpọ asị nʼọnọdụ ịhụnanya.

6 Họpụta otu onye ajọ omume ka o guzogide ya;

ka onye na-ebo ebubo ụgha guzokwa nʼaka nri ya.

7 Mgbe a ga-ekpe ya ikpe, ka ọ bụrụ onye ikpe mara,

ka ekpere ya maa ya ikpe ọnwụ.

8 Ka ụbọchị ndụ ya dị ole na ole,

ka onye ọzọ nara ya ọkwa ya.

9 Ka ụmụ ya ghọọ ndị na-enweghị nna,

ka nwunye ya bụrụ nwanyị na-enweghị di.

10 Ka ụmụ ya ghọọ ndị arịrịọ na-enweghị ebe obibi,

ndị e si na mkpọmkpọ ebe ha bi chụpụ.

11 Ka ndị o ji ụgwọ kwakọrọ ihe niile o nwere,

ka ndị ọbịa baa bukọrọ ihe niile ọ rụpụtaara onwe ya.

12 Ka onye ọbụla ghara igosi ya obiọma;

ka onye ọbụla gharakwa imere ụmụ ya ndị ọ hapụrụ ebere.

13 Kama ka ụmụ ụmụ ya niile nwụsịa,

ka a ehichapụkwa aha ha nʼọgbọ nke na-abịa nʼihu.

14 Ka Onyenwe anyị chetakwa mmehie niile nke nna nna ya ha,

ka Onyenwe anyị hapụkwa ịgbaghara mmehie nne ya.

15 Ka Onyenwe anyị na-echeta mmehie ha oge niile;

ma ka o mee ka ha bụrụ ndị a ga-echefu echefu nʼọgbọ niile.

16 Nʼihi na ọ dịghị mgbe o chere echiche banyere imere onye ọzọ obi ebere,

ọ kpagburu ndị ogbenye, ndị nọ na mkpa

na ndị obi ha tiwara etiwa ruo nʼọnwụ.

17 Ọ hụrụ ịbụ ndị ọzọ ọnụ nʼanya,

ka ọbụbụ ọnụ bịakwasị ya;

ọ dịghị atọ ya ụtọ ịgọzi onye ọbụla,

ka ngọzị dị anya site nʼebe ọ nọ.

18 O yikwasịrị ịbụ ọnụ dịka uwe ya;

ọ bara nʼime ahụ ya dịka mmiri,

bakwaa nʼime ọkpụkpụ ya dịka mmanụ.

19 Ka ọ dịịrị ya ka uwe mwụda nke e kere ya gburugburu dịka akwa,

dịka belịt e kegidere ya gburugburu ruo mgbe ebighị ebi.

20 Onyenwe anyị, mee ka nke a bụrụ ụdị ụgwọ ọrụ ndị iro m ga-anata,

bụ ndị ahụ niile na-ekwu okwu ọjọọ megide m.

21 Ma gị onwe gị, Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị

nyere m aka nʼihi aha gị,

site nʼịdị mma nke ịhụnanya gị, napụta m.

22 Nʼihi na abụ m ogbenye na onye nọ na mkpa,

obi m tiwakwara etiwa nʼime m.

23 Ana m efu dịka onyinyo nke a na-ahụ anya mgbe anwụ dara;

adịkwa m ka igurube nke onye m bekwasịrị nʼahụ ya na-efechapụ.

24 Ike agwụla ikpere m, nʼihi ibu ọnụ;

ataakwala m ahụ, bụrụ naanị ọkpụkpụ.

25 Aghọọla m onye e ji eme ihe ọchị nye ndị na-ebo m ebubo,

mgbe ha hụrụ m, ha na-efufe isi ha.

26 Nyere m aka, o Onyenwe anyị Chineke m;

zọpụta m dịka ịhụnanya gị si dị.

27 Ka ha mara na ọ bụ aka gị,

na ọ bụ gị, o Onyenwe anyị, mere ya.

28 Ha nwere ike nọgide na-abụ ọnụ, ma ị ga-agọzi;

mgbe ha ga-abịa ọgụ, a ga-eme ha ihe ihere,

ma ohu gị ga-aṅụrị ọṅụ.

29 A ga-eji ihere yikwasị ndị na-ebo m ebubo dịka uwe

werekwa ihere kee ha gburugburu dịka uwe mwụda.

30 Aga m eji ọnụ m jaa Onyenwe anyị mma nke ukwuu;

nʼetiti ọha mmadụ dị ukwuu, aga m eto ya.

31 Nʼihi na ọ na-eguzo nʼaka nri nke onye nọ na mkpa,

ịzọpụta ya site nʼaka ndị na-ama ya ikpe ọnwụ.

Veja também

Publicidade
Bíblia Online Bíblia Online

Bíblia Online • Versão: 2026-06-16_06-50-08-