Publicidade

Salmos 33

Ịdị mma na ịdị ukwuu Onyenwe anyị

1 Tienụ mkpu ọṅụ nye Onyenwe anyị, unu ndị ezi omume;

nʼihi na ọ bụ ihe ziri ezi ka ndị obi ha ziri ezi too ya.

2 Werenụ ụbọ akwara too Onyenwe anyị;

werenụ une nke nwere akwara iri kpọọrọ ya egwu.

3 Bụkuonụ ya abụ ọhụrụ;

were ǹka kpọọ ụbọ akwara ma tiekwa mkpu ọṅụ.

4 Nʼihi na okwu Onyenwe anyị niile ziri ezi bụrụkwa eziokwu;

o kwesiri ntụkwasị obi nʼọrụ ya niile.

5 Onyenwe anyị na-ahụ ezi omume na ikpe ziri ezi nʼanya;

ụwa niile jupụtara nʼịhụnanya ya nke na-enweghị ọgwụgwụ.

6 Ọ bụ site nʼokwu ọnụ Onyenwe anyị ka e ji kee eluigwe niile,

jirikwa nkuume nke ọnụ ya mee anwụ, na ọnwa na kpakpando niile.

7 Ọ bụ ya kekwara osimiri niile chịkọta ha nʼotu ebe,

kpaa oke ebe ha ga-anọ dịka ụlọakụ dị ukwuu.

8 Ka ụwa niile tụọ Onyenwe anyị egwu;

ka mmadụ niile bi nʼụwa sọpụrụ ya.

9 Nʼihi na o kwuru okwu, okwu ahụ mezukwara;

o nyere iwu, iwu ahụ guzokwara chịm.

10 Onyenwe anyị na-emebi atụmatụ mba niile;

ọ na-emebi ebumnobi ụmụ mmadụ.

11 Atụmatụ Onyenwe anyị na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi,

ebumnobi ya ruo ọgbọ niile.

12 Mba a gọziri agọzi ka mba ahụ bụ, bụ ndị Chineke bụ Onyenwe anyị ha;

bụ ndị ọ họpụtara ka ha bụrụ ihe nketa ya.

13 Onyenwe anyị si nʼeluigwe na-ele ndị mmadụ bi nʼụwa anya.

Ọ na-ahụzu ụmụ mmadụ niile anya.

14 O sitere nʼebe obibi ya na-ele

onye ọbụla bi nʼelu ụwa anya.

15 Ebe ọ bụ ya kpụrụ obi mmadụ niile nʼotu na otu;

ọ na-ahụzu, na-amazukwa ihe niile ha na-eme.

16 Ọnụọgụgụ ndị agha eze apụghị ịzọpụta ya;

o nweghị onye agha ọbụla na-azọpụta onwe ya, site nʼịdị ukwuu nke ike ya.

17 Ịnyịnya agha ezukwaghị iwetara ndị na-agba ha mmeri nʼagha.

Ọ bụ ezie na ịnyịnya dị ike, ma ha apụghị ịzọpụta ndị nwe ha.

18 Ma Onyenwe anyị ji anya ya na-eche ndị niile na-atụ ya egwu nche,

ya bụ ndị niile na-atụkwasị obi ha nʼịhụnanya ya, nke na-adịghị agwụ agwụ.

19 Ọ ga-anapụta ha site nʼaka ọnwụ.

Ọ ga-echebekwa ha ọ bụladị nʼoge ụnwụ.

20 Anyị ji olileanya eche Onyenwe anyị;

ọ bụ ya bụ inyeaka anyị na ọta anyị.

21 Obi anyị na-aṅụrị ọṅụ nʼime ya;

nʼihi na anyị tụkwasịrị aha nsọ ya obi.

22 O Onyenwe anyị, ka ịhụnanya gị na-adịgidere anyị,

dịka olileanya anyị dị na gị.

Veja também

Publicidade
Bíblia Online Bíblia Online

Bíblia Online • Versão: 2026-06-16_06-50-08-