Publicidade

Salmos 28

Abụ Ọma Devid.
Ekpere maka enyemaka na-ekele

1 Gị Onyenwe anyị ka m na-akpọku;

gị bụ Oke nkume m,

agbala m nkịtị.

Ọ bụrụ na ị jụ ịza m,

aga m eyi otu nʼime ndị ahụ na-arịda nʼolulu.

2 Nụrụ arịrịọ m maka ebere

dịka m na-akpọku gị maka enyemaka,

mgbe m chịlịri aka m abụọ elu

nʼEbe gị Kachasị Nsọ.

3 Adọkpụrụla m tinyere ndị ajọ mmadụ,

tinyekwara ndị na-eme ajọ ihe,

ndị ji ire ụtọ agwa ndị agbataobi ha okwu udo,

ma ha bu iro nʼime obi ha.

4 Kwụghachi ha dịka ọrụ ọjọọ ha

na omume ha kwesiri;

kwụghachi ha maka ihe aka ha mere,

ka ihe ga-adakwasị ha bụrụ ihe ha kwesiri iketa.

5 Nʼihi na ha adịghị aghọta ọrụ niile nke Onyenwe anyị,

ha adịghịkwa aghọta ihe aka ya abụọ rụrụ,

ọ ga-akwada ha nʼala,

ọ gaghị ewulikwa ha elu ọzọ.

6 Toonu Onyenwe anyị,

nʼihi na o gere ntị nʼarịrịọ m rịọrọ ya ka o meere m ebere.

7 Onyenwe anyị bụ ike m na ọta m;

ana m atụkwasị ya obi m, si otu a bụrụ onye a na-enyere aka.

Obi m na-awuli elu nʼihi ọṅụ,

aga m ejikwa abụ m na-eto ya.

8 Onyenwe anyị bụ ike nke ndị ya,

ebe mgbaba e wusiri ike nke nzọpụta dịịrị onye ya etere mmanụ.

9 Zọpụta ndị gị, gọzikwaa ihe nketa gị;

buuru ha onye ọzụzụ atụrụ, na-ekukwa ha ruo mgbe ebighị ebi.

Veja também

Publicidade
Bíblia Online Bíblia Online

Bíblia Online • Versão: 2026-06-16_18-40-07-