Publicidade

Salmos 149

Abụ otuto

1 Toonu Onyenwe anyị!

Bụkuonụ Onyenwe anyị abụ ọhụrụ.

Bụọnụ abụ ito ya nʼetiti ndị nsọ ya.

2 Ka Izrel ṅụrịa ọṅụ nʼime onye kere ha;

ka ndị bi na Zayọn nwee obi ụtọ nʼime Eze ha.

3 Ka ha jiri ite egwu too aha ya

ka ha jiri ọyọ na ụbọ akwara kpọọrọ ya egwu.

4 Nʼihi na ihe banyere ndị ya na-atọ Onyenwe anyị ụtọ.

Ọ na-eji nzọpụta kpukwasị ndị dị umeala nʼobi nʼisi dịka okpueze.

5 Ka ndị nsọ ṅụrịa ọṅụ nʼime nsọpụrụ a,

bụkwaa abụ nʼihi ọṅụ nʼelu ihe ndina ha.

6 Ka otuto Chineke dịrị nʼọnụ ha,

ka mma agha ihu abụọ dịrịkwa nʼaka ha,

7 iji bọọrọ mba niile ọbọ

taakwa ndị niile dị iche iche ahụhụ,

8 iji mkpọrọ igwe kee ndị eze ha

na ndị ha a na-asọpụrụ agbụ igwe,

9 imezu ihe ahụ e kpebiri, depụtakwa megide ha.

Nke a bụ nsọpụrụ dịrị ndị nsọ ya.

Toonu Onyenwe anyị.

Veja também

Publicidade
Bíblia Online Bíblia Online

Bíblia Online • Versão: 2026-06-16_18-40-07-