Publicidade

Salmos 89

Abụ maskil nke Etan, onye Ezra.
Ọgbụgba ndụ Chineke na Devid

1 Aga m abụ abụ banyere oke ịhụnanya Onyenwe anyị ruo mgbe ebighị ebi;

aga m eji ọnụ m mee ka ọgbọ niile mara

maka ikwesi ntụkwasị obi gị.

2 Aga m ekwupụta na ịhụnanya gị na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi;

na i mere ka ikwesi ntụkwasị obi gị, guzosie ike nʼeluigwe.

3 Onyenwe anyị sịrị, "Mụ na onye m họpụtara agbaala ndụ.

Aṅụọkwala m iyi nye ohu m Devid sị,

4 ‘Aga m eme ka agbụrụ gị guzosie ike ruo mgbe ebighị ebi

meekwa ka ocheeze gị dịgide ruo ọgbọ niile.’ " Sela

5 O Onyenwe anyị, eluigwe na-eto ọrụ ebube gị niile,

na ikwesi ntụkwasị obi gị, nʼetiti nzukọ ndị dị nsọ.

6 Nʼihi, ọ bụ onye nʼeluigwe niile, ka a ga-eji tụnyere Onyenwe anyị?

Onye yiri Onyenwe anyị nʼetiti ndị mmụọ ozi niile?

7 Na nzukọ ndị nsọ, Chineke bụ onye a na-atụ oke egwu;

ọ dị oke egwu karịa ndị niile gbara ya gburugburu.

8 O Onyenwe anyị Chineke Onye pụrụ ime ihe niile, onye dịka gị?

Gị, O Onyenwe anyị, dị ike nke ukwuu, ikwesi ntụkwasị obi gị na-agba gị gburugburu.

9 Ị na-achị osimiri nke ji ike na-asọ;

mgbe ebili mmiri ya na-amali elu; i na-eme ka ha dajụọ.

10 Ị zọpịara Rehab dịka otu nʼime ndị ahụ e gburu egbu;

jiri aka gị dị ike chụsasịa ndị iro gị.

11 Ọ bụ gị nwe eluigwe; gị nwekwa ụwa,

ọ bụ gị tọrọ ntọala elu ụwa dum, na ihe niile dị nʼime ya.

12 Ọ bụ gị kere ugwu na ndịda;

Taboa na Hemon na-abụ abụ ọṅụ nʼihi aha gị.

13 Aka gị ka e mejupụtara nʼike;

aka gị dị ike, a na-ebuli aka nri gị elu.

14 Ezi omume na ikpe ziri ezi, bụ ntọala ocheeze gị;

ịhụnanya na ikwesi ntụkwasị obi, na-aga nʼihu gị.

15 Ndị a gọziri agọzi ka ndị ahụ bụ ndị na-eji olu iti mkpu ọṅụ na-abụku gị abụ,

ndị na-ejegharịkwa nʼìhè nke ihu gị, O Onyenwe anyị.

16 Ha na-aṅụrị ọṅụ nʼaha gị ogologo ụbọchị niile;

ha na-aṅụrị nʼezi omume gị.

17 Nʼihi na ị bụ ebube na ike ha,

site nʼihuọma gị, ị na-ebuli mpi anyị elu.

18 Nʼezie, ọta anyị bụ nke Onyenwe anyị,

eze anyị bụkwa nke Onye nsọ Izrel.

19 I kwuru okwu otu mgbe site nʼọhụ,

nye ndị gị kwesiri ntụkwasị obi sị:

"Enyela m otu onye dị ike agha ike;

Ebuliela m otu nwa okorobịa elu site nʼetiti ndị m.

20 Achọtala m Devid ohu m,

were mmanụ nsọ m tee ya.

21 Aka m ga-agba ya ume;

nʼezie, aka m ga-eme ka ọ dị ike.

22 Ọ dịghị onye iro ga-abịakwasị ya, na mberede;

ọ dịghị onye ajọ omume ga-emegbu ya.

23 Aga m etigbu ndị iro ya niile nʼihu ya.

Aga m emekwa ka ndị niile na-akpọ ya asị laa nʼiyi.

24 Ịhụnanya m kwesiri ntụkwasị obi ga-adịnyere ya,

site nʼaha m, a ga-ebuli mpi ya elu.

25 M ga-edo aka ya nʼoke osimiri,

dokwaa aka nri ya nʼosimiri niile.

26 Ọ ga-akpọ m sị m, ‘Ị bụ Nna m,

bụrụkwa Chineke m, na oke Nkume nzọpụta m.’

27 Aga m eme ya nwa mbụ m,

onye kachasị dị elu nʼebe eze niile nke ụwa nọ.

28 Aga m eme ka ịhụnanya m nwere nʼebe ọ nọ dịgide ruo ebighị ebi,

ọgbụgba ndụ mụ na ya ga-adịgidekwa.

29 Aga m eme ka agbụrụ ya guzosie ike ruo mgbe ebighị ebi,

ocheeze ya ga-adịgidekwa dịka eluigwe na-adịgide.

30 "Ọ bụrụ na ụmụ ya elefuo iwu m niile anya,

gharakwa ijegharị nʼụzọ m niile,

31 ọ bụrụ na ha elelịa ụkpụrụ m niile anya,

hapụkwa idebe ihe m nyere ha nʼiwu,

32 aga m eji mkpọrọ taa ha ahụhụ maka mmehie ha,

tikwaa ha ụtarị maka njehie ha;

33 ma agaghị m ewezuga ịhụnanya m, nʼebe ha nọ.

Ma ọ bụ laa azụ nʼikwesị ntụkwasị obi m.

34 Agaghị m emerụ ọgbụgba ndụ m.

Agakwaghị m agbanwe ihe ọbụla siterela nʼọnụ m pụta.

35 Ejirila m ịdị nsọ m ṅụọ iyi, kpebie

na m apụghị ịghara Devid ụgha,

36 na agbụrụ ya ga-adịgide ruo mgbe ebighị ebi,

ocheeze ya ga-adịgidekwa nʼihu m ka anyanwụ na-adịgide.

37 Ọ ga-adịgide ruo ebighị ebi dịka ọnwa.

E, dịka ọnwa ahụ, onye akaebe m kwesiri ntụkwasị obi na mbara eluigwe." Sela

38 Ma ị jụla, i werela nlelị jụkwa,

i na-ewe iwe dị ukwu megide onye gị e tere mmanụ.

39 Ị jụla ọgbụgba ndụ gị na ohu gị gbara

i merụọla okpueze ya nʼime ntụ dị nʼala.

40 Ị kụtuola mgbidi gbara ya gburugburu,

i meela ka ebe ya niile e wusiri ike bụrụ ihe dapịara adapịa.

41 Ndị niile si ụzọ ahụ na-agafe, ezuruchaala ihe niile o nwere.

Ndị agbataobi ya na-akwakwa ya emo.

42 I meela ka aka nri ndị iro ya dị elu;

mekwaa ka ndị iro ya ṅụrịa ọṅụ.

43 I meela ka aka o ji jide mma agha ya sụọ ngọngọ,

i nyereghị ya aka mgbe agha dara.

44 I meela ka ịma mma ya gwụsịa.

Ị tụdakwala ocheeze ya nʼala.

45 I meela ka ụbọchị ndụ nke okorobịa ya dị mkpụmkpụ.

I ji ihere dịka akwa kpuchie ya.

46 Ruo ole mgbe Onyenwe anyị, ka ị ga-ezonarị onwe gị?

Ruo ole mgbe ka iwe gị dị ukwuu ga-eregide dịka ọkụ?

47 Cheta, na ndụ m bụ ihe na-agafe ngwangwa.

Nʼihi ihe efu gịnị ka i ji kee mmadụ niile!

48 Olee onye ahụ nwere ike ịdị ndụ ghara ịhụ ọnwụ anya,

maọbụ zọpụta onwe ya site nʼike nke ili? Sela

49 O Onyenwe anyị, olee ebe oke ịhụnanya mbụ dị,

nke i sitere nʼikwesị ntụkwasị obi gị ṅụọrọ Devid nʼiyi?

50 Onyenwe m, cheta otu e si leda ndị ohu gị anya,

otu m si anagide nʼime obi m ịchị ọchị niile nke ndị mba niile.

51 O Onyenwe anyị, ịchị ọchị nke ndị iro gị ji akwa m emo,

nke ha ji lelịa nzọ ụkwụ niile nke onye gị i tere mmanụ.

52 Otuto dịrị Onyenwe anyị ruo mgbe ebighị ebi.

Amen na Amen.

Veja também

Publicidade
Bíblia Online Bíblia Online

Bíblia Online • Versão: 2026-06-16_18-40-07-