Pular para o conteúdo
Publicidade

Abụ Ọma 131

Abụ nrigo, nke Devid.

Abụ nke ndị dị nwayọọ nʼobi

1 O Onyenwe anyị, nganga adịghị nʼobi m,

ndụ mpako abụkwaghị ọchịchọ m;

adịghị m etinye onwe m nʼokwu karịrị m

maọbụ nʼihe ndị dị ukwuu karịa m.

2 Ma ana m edere duu, mkpụrụobi m nọkwa jụụ;

dịka nwantakịrị a napụrụ ara, ya na nne ya nọ,

e, dịka nwantakịrị a napụrụ ara, otu a ka mkpụrụobi m nọ nʼime m.

3 Ndị Izrel, ka olileanya unu dịrị na Onyenwe anyị131:3 Abụ 130:7

ugbu a na mgbe niile ebighị ebi.

Estes versículos te tocaram? Ore agora!

+581 estão orando agora.

Junte-se à corrente de oração.

Veja também