Publicidade

Salmos 16

Abụ miktam nke Devid.
Ekpere maka iguzosi ike

1 Chebe m, O Chineke,

nʼihi na nʼime gị ka m gbabara izere ndụ.

2 A gwara m Onyenwe anyị, "Ị bụ Onyenwe m,

e wezuga gị, enwekwaghị m ọdịmma ọbụla."

3 Ana m asị maka ndị nsọ bụ ndị nọ nʼala a,

"Ha bụ ndị a na-asọpụrụ, ndị ihe ha nʼatọ m ụtọ."

4 Iru ụjụ nke ndị ahụ na-agbaso chi ndị ọzọ ga-aba ụba.

Agaghị m eso ha wụsa aja ihe ọṅụṅụ ọbara nye chi ndị a,

maọbụ were egbugbere ọnụ m kpọọ aha ha.

5 Onyenwe anyị, i nyeela m oke m na iko m;

ị na-elekọta ihe niile bụ nke m site nʼife nza.

6 Ọtụtụ oke ala niile dabara m nʼebe dị ezi mma;

nʼezie, e nwere m ihe nketa nke na-enye m ọṅụ.

7 Aga m eto Onyenwe anyị, onye na-adụ m ọdụ;

ọ bụladị nʼabalị, obi m na-agwa m ihe m ga-eme.

8 Ana m elekwasị Onyenwe anyị anya mgbe niile.

Ebe ọ nọ nʼaka nri m, agaghị m ama jijiji.

9 Nʼihi nke a, obi dị m ụtọ, ire m jupụtakwara nʼọṅụ;

aga m anọkwa nʼudo.

10 Nʼihi na ị gaghị ahapụ m nʼala mmụọ,

ị gaghị ekwekwa ka Onye gị kwesiri ntụkwasị obi hụ ire ure.

11 I gosila m ụzọ ndụ;

ị ga-eji ọṅụ mejupụta obi m nʼihu gị;

ya na ihe ụtọ ndị dị nʼaka nri gị ruo ebighị ebi.

Veja também

Publicidade
Bíblia Online Bíblia Online

Bíblia Online • Versão: 2026-06-16_18-40-07-