Pular para o conteúdo
Publicidade

Abụ Ọma 123

Abụ nrigo.

Ekpere maka ebere

1 Ana m eweli anya m abụọ elu ile gị,

gị onye ocheeze ya dị nʼeluigwe.

2 Dịka ohu si elekwasị nna ya ukwu anya ya,

na dịka ohu nwanyị na-eje ozi si elekwasị nne ya ukwu anya, ịnata ozi ga-eje,123:2 Nʼoge ochie, ndị nwere ohu adịghị e kwuru ha okwu mgbe a na-ezi ha ozi, kama ọ bụ aka ka nne ha ukwu maọbụ nna ha ukwu ji agwa ha ihe ha kwesiri ime.

otu a ka anyị si na-elekwasị Onyenwe anyị bụ Chineke anyị anya,

ruo mgbe ga-emere anyị ebere.

3 Meere anyị ebere, O Onyenwe anyị, meere anyị ebere,

nʼihi na anyị abụrụla ndị a na-akọcha akọcha.

4 Nʼihi na nnagide anyị na-anagide

ịchị ọchị ndị nganga,

na ileda anya ndị mpako adịla ukwuu.

Estes versículos te tocaram? Ore agora!

+581 estão orando agora.

Junte-se à corrente de oração.

Veja também