Publicidade

Salmos 103

Abụ Ọma Devid.
Gọzie Onyenwe anyị

1 Mkpụrụobi m, too Onyenwe anyị;

ka ihe niile dị nʼime m too aha nsọ ya.

2 Mkpụrụobi m, too Onyenwe anyị;

echefukwala mmeso ọma ya niile,

3 ọ bụ ya na-agbaghara gị mmehie gị niile;

na-agwọkwa gị ọrịa gị niile,

4 onye na-agbapụta ndụ gị site nʼolulu

werekwa ịhụnanya na ọmịiko kpukwasị gị dịka okpueze,

5 onye na-eji ezi ihe na-emejupụta ọchịchọ gị niile,

ka oge okorobịa gị bụrụ ihe a gbanwere dịka nke ugo.

6 Onyenwe anyị na-arụ ọrụ ezi omume,

na-ekpe ikpe ziri ezi nye ndị a na-emegbu emegbu.

7 O mere ka Mosis mata ụzọ ya,

mekwaa ka ụmụ Izrel mara ọrụ ya dị iche iche:

8 Onyenwe anyị nwere obi ọmịiko na-emekwa amara.

Ọ dịghị ewe iwe ọsịịsọ, o jupụtara nʼịhụnanya.

9 Iwe ya anaghị adịgide ruo mgbe ebighị ebi,

ọ bụghị oge niile ka ọ na-anọgide na-ata mmadụ ụta;

10 ọ bụghị dịka mmehie anyị si dị ka ọ na-emeso anyị,

ọ dịghị akwụghachi anyị dịka ajọ omume anyị si dị.

11 Nʼihi na dịka eluigwe si dị elu karịa ụwa,

otu a ka ịhụnanya ya si dị ukwuu nʼebe ndị na-atụ egwu ya nọ.

12 Dịka ọwụwa anyanwụ si dị anya, site nʼọdịda anyanwụ,

otu a ka o sirila mee ka mmehie anyị niile dịrị anya site nʼebe anyị nọ.

13 Dịka nna si enwe obi ebere nʼebe ụmụ ya nọ,

otu a ka Onyenwe anyị si enwe obi ebere nʼebe ndị na-atụ egwu ya nọ,

14 nʼihi na ya onwe ya maara otu e si kpụọ anyị,

ọ na-echeta na anyị bụ aja.

15 Ebe mmadụ nọ, ụbọchị ya niile dị ka ahịhịa,

ọ na-etopụta, na-awasa dịka okoko osisi ọhịa,

16 ifufe na-efesi ya ike, ọ na-adakwa,

adịghị echetakwa ya nʼọnọdụ mbụ ya.

17 Ma ịhụnanya Onyenwe anyị na-adịgide site

nʼebighị ebi ruo ebighị ebi nʼetiti ndị na-atụ egwu ya.

Ezi omume ya na-adịgidekwara ụmụ ụmụ ha,

18 nye ndị ahụ niile na-edebe ọgbụgba ndụ ya

na ndị na-echeta irubere ụkpụrụ ya isi.

19 Onyenwe anyị emeela ka ocheeze ya guzosie ike nʼeluigwe,

alaeze ya na-achị ihe niile.

20 Toonu Onyenwe anyị, unu ndị mmụọ ozi ya,

unu ndị dị ike ndị na-eme ihe ọ chọrọ,

na-erubere okwu ya isi.

21 Toonu Onyenwe anyị unu usuu ndị agha ya niile;

unu ndị na-ejere ya ozi, ndị na-eme uche ya.

22 Toonu Onyenwe anyị, ọrụ aka ya niile

nʼebe ọbụla ọ na-achị.

Mkpụrụobi m, too Onyenwe anyị.

Veja também

Publicidade
Bíblia Online Bíblia Online

Bíblia Online • Versão: 2026-06-16_06-50-08-