Publicidade

Salmos 36

Abụ Ọma dịrị onyeisi abụ. Abụ Ọma Devid, bụ ohu Onyenwe anyị.
Ajọ omume mmadụ na ịdị mma Chineke

1 E nwere m ozi dị nʼime obi nke sitere nʼaka Chineke

banyere ndụ mmehie nke ndị na-eme ajọ ihe:

Ọ dịghị ịtụ egwu Chineke

dị nʼanya ha.

2 Nʼihi ha na-agwarịta onwe ha okwu ire ụtọ nʼanya ha onwe ha,

na o nweghị ụzọ a ga-esi nwe ike ịchọpụta mmehie ha maọbụ kpọọ ya asị.

3 Okwu ọnụ ha niile bụ ihe ọjọọ na aghụghọ;

ha adịghị eji uche eme ihe maọbụ mee ihe dị mma.

4 Ọ bụladị mgbe ha nọ nʼelu ihe ndina ha, ha na-eche echiche ajọ ihe;

ha enyefeela onwe ha nʼaka ndụ ajọ omume,

ha adịghị ajụkwa ihe na-ezighị ezi.

5 O Onyenwe anyị, ịhụnanya gị na-eru mbara eluigwe,

ikwesi ntụkwasị obi gị na-erukwa igwe ojii nke eluigwe.

6 Ezi omume gị dịka ugwu dị ukwuu,

ikpe ikpe ziri ezi gị dịka omimi nke oke osimiri.

O Onyenwe anyị, ị na-echebe ụmụ mmadụ na anụmanụ.

7 Lee ka ịhụnanya gị nke na-adịghị agwụ agwụ si dị oke ọnụahịa, O Chineke!

Ụmụ mmadụ na-agbaba nʼokpuru ndo nke nku gị abụọ.

8 Ha na-eri oriri site nʼịba ụba nke ụlọakụ gị;

Ị na-enyekwa ha mmiri site nʼiyi nke obi ụtọ gị.

9 Nʼihi na mmiri na-enye ndụ dị na gị;

ọ bụkwa nʼìhè gị ka anyị na-ahụ ìhè.

10 Mee ka ịhụnanya gị na-adịgidere ndị maara gị,

ka ezi omume gị na-adịgidekwara ndị ziri ezi nʼobi.

11 Ekwela ka ndị mpako a zọọ m ụkwụ nʼisi,

ekwekwala ka aka ndị ajọ omume nupu m nʼebe m guzo.

12 Lee ka ndị na-eme ajọ ihe si daa nʼala,

a kwatuola ha nʼala, ha apụghịkwa ibilite ọzọ.

Veja também

Publicidade
Bíblia Online Bíblia Online

Bíblia Online • Versão: 2026-06-16_18-40-07-