Publicidade

Salmos 125

Abụ nrigo.
Chineke onye na-echebe ndị ya

1 Ndị niile na-atụkwasị Onyenwe anyị obi na-anọgidesi ike dị ka ugwu Zayọn

nke a na-apụghị inugharị, nke na-adịgidekwa nʼọnọdụ ya ruo mgbe ebighị ebi.

2 Dịka ugwu niile si gbaa obodo Jerusalem gburugburu,

otu a ka Onyenwe anyị na-agba ndị ya gburugburu

ugbu a na ruo mgbe ebighị ebi.

3 Mkpara ọchịchị ndị ajọ omume agaghị adịgide

nʼala ndị ezi omume ketara nʼife nza,

nʼihi na ndị ezi omume nwere ike

itinye aka ha na-ime ihe ọjọọ.

4 O Onyenwe anyị, meere ndị niile na-eme ezi omume ihe ọma,

ya bụ, ndị niile obi ha ziri ezi.

5 Ma Onyenwe anyị ga-achụpụ ndị niile na-agbaso ụzọ aghụghọ

na ndị niile na-eme ajọ ihe.

Ka udo dịrị Izrel.

Veja também

Publicidade
Bíblia Online Bíblia Online

Bíblia Online • Versão: 2026-06-16_06-50-08-