Publicidade

Salmos 120

Abụ nrigo.
Ekpere maka nnapụta

1 Ana m akpọku Onyenwe anyị nʼime nsogbu m,

ọ na-azakwa m.

2 O Onyenwe anyị, zọpụta m

site nʼegbugbere ọnụ okwu ụgha

na ire na-ekwu okwu aghụghọ.

3 Gịnị ka a ga-eme gị,

ọ bụkwa gịnị ọzọ ka a gatụkwasịri gị,

gị ire aghụghọ?

4 Ọ ga-eji àkụ dị nkọ nke dike nʼagha taa gị ahụhụ,

ya na icheku ọkụ osisi brum na-ere ere.

5 Ahụhụ dịịrị m nʼihi na m bi na Meshek,

nʼihi na m bikwa nʼetiti ụlọ ikwu ndị Keda!

6 Ogologo oge

ka m binyere ndị kpọrọ udo asị.

7 Abụ m onye udo;

ma mgbe m kwuru okwu, okwu ha bụ okwu agha.

Veja também

Publicidade
Bíblia Online Bíblia Online

Bíblia Online • Versão: 2026-06-16_06-50-08-