Publicidade

Salmos 56

Abụ Ọma nke dịrị onyeisi abụ. bụ olu abụ "Nduru nọ nʼosisi Ook dị ebe dị anya." Abụ nke Devid ka eji agụ ya. Abụ miktam. Mgbe ndị Filistia nọchibidoro ya nʼobodo Gat.
Ekpere maka mgbapụta

1 O Chineke, meere m ebere,

nʼihi na ndị mmadụ ji ike na-achụso m;

ogologo ụbọchị niile, ha na-ebu agha imegide m.

2 Ogologo ụbọchị niile ndị iro m na-achụso m;

site na nganga ha, ọtụtụ na-ebu agha megide m.

3 Ma mgbe ụjọ na-atụ m, bụ na gị ka m na-atụkwasị obi m.

4 Nʼime Chineke onye m na-eto okwu ya,

nʼime Chineke ka m na-atụkwasị obi; ụjọ agaghị atụ m.

Gịnị ka mmadụ efu pụrụ ime m?

5 Ogologo ụbọchị niile, ha na-asụgharị okwu m kwuru isi;

oge niile ka ha na-atụ atụmatụ imerụ m ahụ.

6 Ha na-agba izu nzuzo na-ezokwa onwe ha,

ha na-enyochapụta nzọ ụkwụ m niile,

dịkwa njikere ịnapụ m ndụ m.

7 Nʼihi ajọ omume ha, ekwekwala ka ha gbapụ;

o Chineke, nʼime iwe gị, wedaa mba ndị a niile dị iche iche nʼala.

8 Depụta akwa arịrị m;

chekọtasịa anya mmiri akwa m niile nʼime karama gị.

bụ na ha adịghị nʼakwụkwọ ndepụta gị?

9 Mgbe m ga-akpọku gị maka enyemaka,

ndị iro m ga-agbaghachi azụ.

Site nʼụzọ dị otu a, aga m amara na Chineke nọnyeere m.

10 Nʼime Chineke, onye m na-eto okwu ya,

nʼime Onyenwe anyị, onye m na-eto okwu ya,

11 nʼime Chineke ka m na-atụkwasị obi; ụjọ agaghị atụ m.

Gịnị ka mmadụ pụrụ ime m?

12 O Chineke m, nʼisi m ka nkwa niile m kwere gị dị;

aga m ewetara gị onyinye ekele m niile.

13 Nʼihi na zọpụtala m site nʼọnwụ,

ma napụta ụkwụ m site nʼịsọ ngọngọ,

ka m nwee ike jegharịa nʼihu Chineke,

nʼìhè nke ndụ.

Veja também

Publicidade
Bíblia Online Bíblia Online

Bíblia Online • Versão: 2026-06-28_14-13-17-