Admiração
O temor do Senhor é o princípio da sabedoria. A admiração reverente por Deus é a postura que produz conhecimento, obediência e bênção na vida do crente.
Ịtụ egwu Onyenwe anyị bụ mmalite ihe ọmụma.
Ọ bụkwa naanị ndị nzuzu bụ ndị na-adịghị anabata amamihe na ịdọ aka na ntị.
Nʼihi na ịtụ egwu Onyenwe anyị bụ mmalite amamihe,
inwe ihe ọmụma banyere onye Nsọ ahụ bụkwa nghọta.
Ịtụ egwu Onyenwe anyị bụ amamihe na-abịa site nʼịdọ aka na ntị;
onye dị umeala nʼobi ga-anata ugwu na nsọpụrụ.
Ọ dị mma inwe akụnụba dị nta ma bụrụ onye na-atụ egwu Onyenwe anyị,
karịa inwe akụ ma nọrọ na nsogbu.
Ịtụ egwu Onyenwe anyị bụ ịkpọ ihe ọjọọ asị.
Akpọrọ m nganga na mpako,
omume ọjọọ nakwa okwu gbagọrọ agbagọ asị.
Obi umeala bụ egwu Onyenwe anyị,
ụgwọ ọ na-akwụ bụ akụnụba, na nsọpụrụ na ndụ ogologo.
A bụla onye maara ihe nʼanya nke onwe gị.
Tụọ Onyenwe anyị egwu, kpọọkwa ihe ọjọọ asị.
Nke a ga-eme ka i nwee ahụ ike
gbaakwa ọkpụkpụ gị ume.
Ịma mma nke elu ahụ adịghị egosi ihe mmadụ bụ, nʼihi na ịma mma adịghị adịgide ogologo oge.
Ma nwanyị ọbụla nke na-atụ egwu Onyenwe anyị bụ onye e kwesiri ito.
Ugbu a anụla ihe ndị a niile,
ma nụrụ ihe bụ nkwubi okwu:
Tụọ egwu Chineke, debekwa iwu ya niile,
nʼihi na nke a bụ ọrụ niile dịrị mmadụ.
Ịtụ egwu Onyenwe anyị bụ mmalite amamihe;
ndị niile na-edebe ụkpụrụ ya nwere ezi nghọta.
Otuto ya na-adị ruo mgbe ebighị ebi.
Toonu Onyenwe anyị.
Onye a gọziri agọzi ka nwoke ahụ bụ onye na-atụ egwu Onyenwe anyị;
onye na-enwe oke mmasị idebe iwu ya niile.
Ngọzị na-adịrị ndị niile na-atụ egwu Onyenwe anyị,
ndị na-aga ije nʼirube isi nye ya.
Ma Onyenwe anyị ji anya ya na-eche ndị niile na-atụ ya egwu nche,
ya bụ ndị niile na-atụkwasị obi ha nʼịhụnanya ya, nke na-adịghị agwụ agwụ.
Chineke ga-agọzi anyị,
nsọtụ niile nke ụwa ga-atụ egwu ya.
Ma unu bụ ndị na-atụ egwu aha m ka anyanwụ nke ezi omume ga-achawapụta wetakwara unu ọgwụgwọ nke si nʼime nku ya. Unu ga-apụkwa, na-awụgharị dịka ụmụ ehi eji nri zujuo afọ.
Ugbu a, Izrel, gịnị ka Onyenwe anyị Chineke gị na-ana nʼaka gị ma ọ bụghị ka ị tụọ egwu Onyenwe anyị bụ Chineke gị, jee ije na nrube isi nye ya, ịhụ ya nʼanya, na iwere obi gị niile na mmụọ gị niile fee ya ofufe, na ilezi anya debezuo iwu na ụkpụrụ Onyenwe anyị, ndị m na-enye gị taa, nʼihi ọdịmma gị.
Ọ bụ Onyenwe anyị bụ Chineke unu ka unu ga-eso, naanị ya ka unu ga-atụ egwu. Debenụ iwu ya niile na-erubekwara ya isi, na-ejere ya ozi, jidesiekwa ya ike.
Chineke nʼonwe ya, nyekwara ndị inyom ahụ na-aghọ nwa ezinaụlọ nke aka ha nʼihi na ha tụrụ egwu Chineke.
Ya mere, ndị enyi m, ebe anyị nwere nkwa ndị a niile, ka anyị debe onwe anyị ọcha nʼime ihe niile ọbụla nke na-emerụ ahụ anyị na mmụọ anyị. Ka anyị mezuo ịdị nsọ nʼịtụ egwu Chineke.
Kwụghachinụ onye ọbụla ihe unu ji ha nʼụgwọ, ọ bụrụ na unu ji ụgwọ ụtụ taks, kwụọnụ ya, ọ bụrụkwa ụgwọ ụtụ isi nke akụnụba unu, ka unu ji, kwụọnụ ya. Ọ bụrụ na onye ọbụla kwesiri ka a sọpụrụ ya, sọpụrụnụ onye dị otu a, ọ bụrụkwa na onye ọbụla kwesiri ka a kwanyere ya ugwu kwanyerenụ ya ugwu.
"Onye ọbụla nʼejichi ebere site nʼebe enyi ya nọ
na-agbakụta egwu Onye pụrụ ime ihe niile azụ.