Publicidade

Eclesiastes 1

Ọ nweghị ihe nwere isi

1 Okwu onye ozizi, nwa Devid, onye bụ eze na Jerusalem.

2 Ihe efu, ihe niile bụ ihe efu

ka onye ozizi na-ekwu.

Ihe na-enweghị isi ka ihe niile bụ.

Ihe niile bụ nnọọ ihe efu.

3 Olee uru mmadụ na-enweta site na ndọgbu niile

ọ na-adọgbu onwe ya nʼọrụ nʼokpuru anyanwụ?

4 Otu ọgbọ laa, ọgbọ ọzọ abịa,

ma ụwa na-adịgide ruo ebighị ebi.

5 Anyanwụ na-awa, na-adakwa,

ma mee ngwangwa laghachi ebe o si awapụta.

6 Ifufe na-efe gaa na ndịda;

feekwa gburugburu gaa nʼugwu,

ọ na-efegharị gburugburu ebe niile;

na-efe na-enweghịkwa nsọtụ.

7 Mmiri dị nʼiyi niile na-asọbanye nʼoke osimiri

ma oke osimiri ejughị eju.

Emesịakwa, mmiri ndị a na-alọghachi nʼiyi ndị a,

malitekwa ịsọkwa na-aga nʼosimiri.

8 Ihe niile nọ na-adọgbu onwe ha nʼọrụ;

ọnụ apụghị ịkọ ụdị ike ọgwụgwụ dịnụ.

Otu ọbụla anyị si lee anya, afọ adịghị eju anya anyị.

Afọ adịghịkwa eju ntị anyị ịnụ ihe, na ige ntị.

9 Ihe ọbụla nke dịrịla na mbụ ga-adịkwa ọzọ.

Ihe ndị mmadụ mere nʼoge gara aga ka a ga-emekwa ọzọ.

Ọ dịkwaghị ihe ọhụrụ ọbụla dị nʼokpuru anyanwụ.

10 Ọ dị ihe enwere ike ikwu sị,

"Lee, ihe a bụ ihe ọhụrụ"?

Ọ bụ ihe dịịrị nʼoge gara aga,

nʼoge ndị garalarị tupu oge anyị.

11 Anaghị echeta ndị mgbe ochie,

otu aka ahụ kwa, ọgbọ na-abịa abịa

ndị ga-eso ha

agakwaghị echeta ha.

Amamihe enweghị isi

12 Mụ onwe m bụ onye nkuzi, bụrịị eze Izrel nʼime Jerusalem. 13 Ekpebiri m, were onwe m nye, iji amamihe nnyochapụta ihe m nwere ike ịmata banyere ihe niile a na-eme nʼime ụwa. Olee ụdị ibu arọ bụ nke a, nke Chineke bokwasịrị ụmụ mmadụ? 14 Enyochaala m ihe niile a na-eme nʼụwa chọpụta na ha enweghị isi. Ọ dị ka mmadụ ịchụgharị ifufe.

15 Ihe gbagọrọ agbagọ, apụghị ime ya ka ọ dizie.

Ihe na-ezughị ezu, enweghị ike ịgụta ha ọnụ.

16 Echere m nʼime obi m sị, "Lee anya! Aghọọla m onye ukwu, bụrụ onye maara ihe karịa ndị eze niile chịrịla na Jerusalem. Enweela m amamihe nʼebe ọ dị ukwu, babigakwa ụba oke nʼihe ọmụma." 17 Nʼihi ya, agbalịsiri m ike ịmụta ihe dị iche nʼetiti ihe ọmụma, na ịyị ara na nzuzu. Ma ihe m chọpụtara bụ na ọ baghị uru. Ọ dị ka itufu oge ịchọ ụzọ ijide ifufe.

18 Nʼihi na mgbe amamihe na-aba ụba, mgbe ahụ ka iwe na ọnụma na-ejupụta,

oke ihe ọmụma na-ewetakwa oke ihe mgbu.

Veja também

Publicidade
Eclesiastes
Ver todos os capítulos de Eclesiastes
Bíblia Online Bíblia Online

Bíblia Online • Versão: 2026-06-15_21-32-39-