Publicidade

Eclesiastes 9

Ihe na-eche mmadụ niile

1 Ihe ndị a niile ka m tulere nke ọma nʼobi m, kpebie na ihe ndị ezi omume na ndị maara ihe na-eme dị nʼaka Chineke, ma ọ dịghị onye maara ihe na-echere ha maọbụ ịhụnanya maọbụ ịkpọ asị. 2 Ihe niile na-adakwasị mmadụ niile nʼotu ụzọ ahụ, ma onye ezi omume ma onye ajọ omume, ezi mmadụ na onye na-abụghị ezi mmadụ, onye dị ọcha na onye na-adịghị ọcha, onye na-achụ aja na onye na-adịghị achụ aja.

Dịka ọ dịrị ezi mmadụ,

otu a ka ọ dịrị onye mmehie;

dịka ọ dịrị ndị na-aṅụ iyi,

otu a kwa ka ọ dị nye ndị na-adịghị aṅụ.

3 Nke a bụkwa ihe ọjọọ na-eme nʼokpuru anyanwụ. Otu ihe ndakwasị dịrị mmadụ niile. Ọzọkwa, obi ụmụ mmadụ jupụtara nʼihe ọjọọ na ịyị ara mgbe ha nọ na ndụ, emesịa ha alakwuru ndị nwụrụ anwụ. 4 Naanị ndị dị ndụ nwere olileanya. Ọ ka mma ịbụ nkịta dị ndụ karịa ịbụ ọdụm nwụrụ anwụ.

5 Nʼihi na ndị dị ndụ maara nke ọma na ha ga-anwụ,

ma ndị nwụrụ anwụ amaghị ihe ọbụla;

ha enwekwaghị ụgwọ ọrụ ọzọ,

nʼihi na ha bụ ndị echefurula echefu.

6 Ịhụnanya ha, na ịkpọ asị ha,

na ekworo ha gabigara mgbe ha nwụrụ.

Ha agaghị enwekwa oke

nʼihe ọbụla na-eme nʼokpuru anyanwụ.

7 Ya mere, gaa nʼihu, jiri ọṅụ rie nri gị, jirikwa ọṅụ ṅụọ ihe ọṅụṅụ nʼihi na ọ bụ ugbu a ka Chineke nabatara ọrụ gị. 8 Yiri akwa dị ọcha mgbe niile, tee mmanụ na-esi isi ụtọ nʼisi gị. 9 Bie ndụ obi ụtọ, gị na nwunye gị ị hụrụ nʼanya, ụbọchị niile nke ndụ ihe efu gị nke Chineke nyere gị nʼokpuru anyanwụ, nʼihi na nke a bụ oke dịịrị gị na ndụ ndọgbu onwe gị nʼọrụ nʼokpuru anyanwụ. 10 Ihe ọbụla ị na-eme, were ike gị niile mee ya, nʼihi na ịrụ ọrụ maọbụ iche echiche, maọbụ ihe ọmụma, maọbụ amamihe adịghị nʼala ndị nwụrụ anwụ. Ebe ahụ kwa ka ị na-aga.

11 Ahụrụ ihe ọzọ nʼokpuru anyanwụ,

ọ bụghị ndị nwere ụkwụ ọsọ na-agbata ihe,

ọ bụkwaghị onye sikarịrị ike na-emeri nʼagha;

ọ bụghị ndị maara ihe ka nri dịrị,

ọ bụghị ndị nwere nghọta ka akụnụba dịrị,

ọzọkwa, ọ bụghị ndị nka ka amara na-adịrị;

kama ọ bụ mgbe na ihe ndaba na-eme ka ihe ndị a dịrị.

12 Nke ka nke, ọ dịghị mmadụ ọbụla maara mgbe oge ya ga-eru:

Ọ dị ka nnụnụ nke mara nʼọnya,

maọbụ azụ e jidere nʼụgbụ.

Dịka ha, ụmụ mmadụ na-adaba nʼọnya nke ihe ọjọọ

mgbe ha na-atụghị anya ya.

Amamihe dị mkpa karịa nzuzu

13 Ahụkwara m ihe ọzọ nʼokpuru anyanwụ, nke a bụ ụdị amamihe nke metụrụ m nʼobi nʼebe ọ dị ukwuu. 14 Ọ dị obodo nke naanị mmadụ ole na ole bi nʼime ya, ma otu eze dị ike chịịrị ndị agha ya bịa ibuso obodo nta a agha. Ndị agha ya gbara obodo a gburugburu na-achọ ịkwatu mgbidi ya. 15 Ma ọ dị otu onye ogbenye bi nʼobodo nta ahụ, onye maara ihe, ọ zọpụtara obodo ahụ site nʼamamihe ya. Ma o nweghị onye chetara ihe banyere ya. 16 Nke a mere m ji sị, inwe amamihe bara uru karịa ịdị ike, ma ọ bụrụ na onye amamihe ahụ bụ onye ogbenye, a ga-eleda ya anya, a gaghị akpọkwa okwu ya ihe.

17 Okwu nke onye maara ihe na-ekwu na nwayọọ ka a na-anụ,

karịa iti mkpu nke onye na-achị achị nʼetiti ndị nzuzu.

18 Amamihe ka ihe agha niile mma,

ma otu onye mmehie na-ala ọtụtụ ezi ihe nʼiyi.

Veja também

Publicidade
Eclesiastes
Ver todos os capítulos de Eclesiastes
Bíblia Online Bíblia Online

Bíblia Online • Versão: 2026-06-15_21-32-39-