Publicidade

Eclesiastes 3

Ihe niile nwere oge

1 Ihe ọbụla nwere oge;

mgbe dịkwara ihe ọbụla a na-eme eme nʼeluigwe.

2 Oge ịmụ nwa na oge ịnwụ anwụ,

oge ịkụ ihe na oge ihopu,

3 oge igbu egbu; na oge ịgwọ ọrịa,

oge itikpọ na oge iwuzi ewuzi,

4 oge ịkwa akwa, na oge ịchị ọchị,

oge iru ụjụ na oge ite egwu,

5 oge ikposa nkume na oge ịchịkọta nkume,

oge ịbakụ na oge ịkwụsị ịbakụ,

6 oge ịchọ ihe, na oge ntufu,

oge ịchịkọba, na oge ichifusi,

7 oge ndọwasị, na oge ndụkọta,

oge ịgba nkịtị, na oge ikwu okwu,

8 oge ịhụnanya na oge ịkpọ asị,

oge ibu agha, na oge ime udo.

9 Gịnị bụ nnọọ ihe mmadụ na-enweta site na ndọgbu niile nke nʼọrụ niile ọ na-arụ? 10 Ahụla m ibu arọ nke Chineke bokwasịrị ndị mmadụ e kere eke. 11 O meela ka ihe niile maa mma nʼoge nke ya. O tinyekwala ebighị ebi nʼime obi ndị mmadụ; ma o nweghị ka mmadụ ghọta ọrụ Chineke site na mmalite ruo nʼọgwụgwụ. 12 Nʼihi ya, ekpebiri m na ihe dịịrị mmadụ ịchọ bụ obi ụtọ na inwe aṅụrị na ndụ ya niile. 13 Ihe ọzọ bụ ka mmadụ rie, ṅụọ, ma nwee afọ ojuju na ndọgbu niile ọ na-adọgbu onwe ya, nʼihi na ha bụ onyinye si nʼaka Chineke. 14 Amaara m na ihe niile Chineke mere na-adịgidekwa. O nweghị ihe apụrụ itinye na ya, o nweghịkwa ihe apụrụ iwepụkwa site na ya. Chineke na-eme nke a ka ndị mmadụ tụọ egwu ya.

15 Ihe ọbụla dị ugbu a, adịlarị na mgbe ochie,

ihe ọbụla gaje ịdị dịlarị na mbụ.

Chineke na-eme ka ihe niile mere na mgbe gara aga megharịakwa ọzọ.

16 Ọzọkwa, achọpụtara m otu ihe nʼokpuru anyanwụ,

na ọnọdụ ezi ikpe naanị mmebi iwu jupụtara,

nʼebe e kwesiri inwe ikpe ziri ezi ị ga-achọpụta na ihe ọjọọ dịkwa ya.

17 A gwara m onwe m,

"Chineke ga-ekpe,

ndị ezi omume na ndị ajọ omume ikpe,

nʼihi na a ga-enwe oge maka ihe ọbụla a na-eme eme,

oge dịkwa maka ikpe ọrụ niile nke mmadụ ikpe."

18 Echere m nʼobi sị, "Ebe mmadụ nọ, Chineke na-anwale ya, ka mmadụ mata na ha dị ka anụmanụ. 19 Nʼihi na ihe na-eche mmadụ na anụmanụ bụ otu. Ha abụọ na-eku ume, ha abụọ na-anwụkwa anwụ. Ọ dịghị ihe mmadụ ji karịa anụmanụ. Ihe niile bụ ihe efu. 20 Ha niile na-alaghachi nʼotu ebe; ọ bụ nʼaja ka ha si pụta, ebe ahụ kwa ka ha ga-alaghachi. 21 Onye pụrụ iguzo gbaa akaebe na mmụọ mmadụ na-ala nʼelu ma nke anụmanụ na-ala nʼaja?"

22 Nʼihi ya, ahụrụ m na ọ dịghị ihe ọzọ ụmụ mmadụ kwesiri ime karịakwa inwe ọṅụ nʼọrụ ha, nʼihi na nke ahụ bụ oke ha nʼebe a. Onye ga-eme ka ha bịaghachi hụ ihe ga-eme nʼazụ ha?

Veja também

Publicidade
Eclesiastes
Ver todos os capítulos de Eclesiastes
Bíblia Online Bíblia Online

Bíblia Online • Versão: 2026-06-16_06-50-08-