Publicidade

Eclesiastes 11

Ịgbasapụ aka

1 Gbasapụ aka gị nʼinye onyinye

nʼihi na mgbe ọtụtụ ụbọchị gasịrị ị ga-anata ụgwọ ọrụ gị.

2 Kee akụ gị ụzọ asaa maọbụ ụzọ asatọ

nʼihi na ị maghị ụdị ihe ndaba ọjọọ nwere ike ịbịakwasị gị nʼobodo.

3 Mgbe eluigwe rujiri,

mmiri ga-ezo;

mgbe osisi dara, maọbụ nʼugwu maọbụ na ndịda,

ebe ahụ ka ọ na-atọgbọ.

4 Onye na-ele ikuku anya agaghị akụ mkpụrụ ọbụla,

onye na-ele igwe ojii anya agaghị ewe ihe ubi.

5 Dịka mmadụ na-apụghị ịmata ụzọ ikuku si aga

maọbụ otu ndụ ọhụrụ si ebido nʼime afọ nwanyị dị ime,

otu a ka o si dịrị ma mmadụ apụghị ịghọta ọrụ Chineke,

onye mere ihe niile.

6 Ghaa mkpụrụ gị nʼụtụtụ,

esepụkwala aka nʼanyasị,

nʼihi na ị maghị nke ga-eto,

maọbụ nke a maọbụ nke ọzọ,

ha niile nwere ike too nke ọma.

Cheta Chineke nʼokorobịa gị

7 Ìhè dị ụtọ,

ọ na-amasịkwa anya ịhụ ìhè anyanwụ.

8 Ọ bụrụ na mmadụ adị ndụ ọtụtụ afọ,

ya ṅụrịa nʼime ihe niile,

ma ya cheta ụbọchị ọchịchịrị

ga-adị ọtụtụ.

Ihe niile ndị na-abịa bụ ihe efu.

9 Nwa okorobịa, ọ bụ ihe oke ọṅụ na ị bụ okorobịa.

Ya mere, ka obi gị nye gị ọṅụ nʼụbọchị niile nke okorobịa gị.

Mee ihe niile ị chọrọ ime;

gbasookwa ihe niile nke anya gị na-ahụ.

Kama, ghọtakwa nke a,

na ị ghaghị ịza ajụjụ nʼihu Chineke nʼihi ihe niile i mere.

10 Ya mere, wezuga nchegbu site nʼobi,

wezugakwa nsogbu nke ahụ gị,

nʼihi na okorobịa na ịdị ike bụ ihe efu.

Veja também

Publicidade
Eclesiastes
Ver todos os capítulos de Eclesiastes
Bíblia Online Bíblia Online

Bíblia Online • Versão: 2026-06-15_21-32-39-