Publicidade

Eclesiastes 5

Kwụghachi nkwa ị kwere Chineke

1 Mgbe ị na-aba nʼụlọ ukwu Chineke, lezie anya. Meghee ntị gị nke ọma, karịa ịchụ aja onyinye nke ndị nzuzu, ndị na-amaghị na ha na-eme ihe ọjọọ.

2 Abụla onye na-eme ọsịịsọ ikwu okwu

maọbụ ime ngwangwa nʼime echiche obi gị,

maọbụ ikwe Chineke nkwa ọnụ efu.

Nʼihi na Chineke nọ nʼeluigwe

ma naanị nʼụwa ka ị nọ,

nʼihi ya ka okwu ọnụ gị dị ole na ole.

3 Dị ka ọtụtụ nchekasị si eweta ị rọọ nrọ,

otu a ka okwu onye nzuzu si dị mgbe ọtụtụ okwu dị ya nʼọnụ.

4 Nʼihi ya, mgbe ị na-ekwe Chineke nkwa, atụfula oge imezu ihe ahụ, nʼihi na ihe banyere ndị nzuzu adịghị atọ Chineke ụtọ. Mezuo nkwa niile i kwere Chineke. 5 Ọ ka mma na ị gbara nkịtị karịa na ị ga-ekwe nkwa ma ị gaghị emezu ya. 6 Ekwela ka ọnụ gị duba gị na mmehie. Azọkwala onwe gị site nʼịgwa onyeozi Chineke, "na i kwere nkwa a na-amaghị ama." Nʼihi gịnị ka Chineke ga-eji wee iwe nʼihi ihe ị kwuru, ma bibiekwa ọrụ aka gị? 7 Aga m eme, aga m eme, ma e meghị ya bụ naanị okwu efu. Ya mere, tụọ egwu Chineke.

Akụnụba enweghị isi

8 Ọ bụrụ na ị hụ ebe a na-emegbu ndị ogbenye, na-anapụkwa ha ihe ruru ha site nʼikpe ikpe na-ezighị ezi na mpaghara obodo a na-achị achị, ya ejula gị anya, nʼihi na onyeisi ọbụla nwere onye na-atụrụ ya. Ndịisi na-atụ iwu nwekwara ndị kachasị ha elu. Otu a kwa, ọ dịkwa ndị dị elu karịa ha. 9 Mgbe ihe nnweta si nʼala ubi bara ụba, ọ na-abara onye ọbụla uru; ọ na-abakwara eze nʼonwe ya uru.

10 Onye ọbụla hụrụ ego nʼanya, ọ gaghị eju ya afọ.

Onye ọbụla hụrụ akụnụba nʼanya adịghị enwe afọ ojuju nʼihe ọbụla.

Nke a bụkwa ihe efu.

11 Akụ na-abawanye,

ndị na-eri ya na-abawanyekwa.

Olee uru ha bara nye onyenwe ha

karịa iji anya ya abụọ na-ele ha?

12 Onye na-arụsị ọrụ ike na-arahụ ụra nke ọma,

ma o riri nri nta ma o rikwaranụ nke dị ukwuu,

ma oke iriju afọ onye ọgaranya

anaghị ekwe ya rahụ ụra.

13 Ahụrụ m ihe ọjọọ ọzọ nʼokpuru anyanwụ,

mmadụ debere akụnụba ruo mgbe o wetara ya ihe mgbu,

14 ma akụnụba ndị ahụ bụ ihe furu site nʼọdachi

nke bụ na mgbe ha mụtara ụmụ,

o nwekwaghị ihe fọdụrụ ụmụ ahụ iketa.

15 Dịka mmadụ si gbara ọtọ site nʼafọ nne ya bata nʼụwa,

otu a ka anyị ga-esi hapụ ya.

O nweghị ihe ọ ga-ebu pụọ site na ndọgbu niile

ọ dọgburu onwe ya nʼọrụ.

16 Ma nke a bụ ihe ọjọọ nke na-egbu mgbu nʼobi.

Mmadụ na-ala dịka o siri bịa.

Gịnị bụ uru ya,

mgbe ọ na-adọgbu onwe ya nʼọrụ nye ifufe?

17 Ụbọchị ndụ ya niile, ọ na-eri ihe nʼọchịchịrị,

site oke mgbagwoju anya, na nsogbu na iwe.

18 Ma achọpụtara m na ọ bụ ihe dị mma na ihe kwesiri omume, ka nwoke rie ihe ma ṅụọkwa ihe ọṅụṅụ Ka ọ chọtakwa afọ ojuju nʼime ndọgbu niile nke ọrụ ọ ruru nʼokpuru anyanwụ, nʼoge mkpụmkpụ ndụ nke Chineke nyere ya. Nʼihi na nke a bụ oke ya. 19 Ọzọkwa, ọ bụrụ na Chineke enye mmadụ akụnụba na ihe nweta, ma nyekwa ya ike ọ ga-eji kporie ndụ nʼime ihe ndị a, ya nabata nke a dị ka oke ya ma were ọṅụ rụọ ọrụ ya. Ha bụ onyinye si nʼaka Chineke. 20 Ebe ọ bụ na Chineke enyela ya obi ụtọ, ụbọchị ndụ ya ekwesighị iwetara ya oke echiche.

Veja também

Publicidade
Eclesiastes
Ver todos os capítulos de Eclesiastes
Bíblia Online Bíblia Online

Bíblia Online • Versão: 2026-06-15_21-32-39-