Publicidade

Eclesiastes 4

Mmegbu, ndọgbu nʼọrụ, na enweghị enyi

1 Ọzọ, ahụrụ m mmegbu na obi ilu niile dị nʼokpuru anyanwụ,

anya mmiri akwa ndị a na-emegbu emegbu,

ma ọ dịkwaghị ndị nkasiobi ha nwere,

ma ike dị nʼaka ndị mmegbu a,

ma ha enwekwaghị ndị nkasiobi.

2 Nʼihi ya, ekwuru m, na ndị nwụrụ anwụ,

bụ ndị nwụrụ anwụ mgbe gara aga,

ka ndị dị ndụ mma,

bụ ndị nke dị ndụ ruo ugbu a.

3 Ma ọ dị mma karịa ha abụọ

bụ onye ahụ a na-amụbeghị,

onye na-ahụbeghị ihe ọjọọ

nke dị nʼokpuru anyanwụ.

4 Achọpụtakwara m na ihe mere ndị mmadụ ji na-adọgbu onwe ha nʼọrụ bụ nʼihi anya ụfụ ha nwere nʼebe ihe ndị agbataobi ha dị. Nke a bụ ihe efu, ịchụso ifufe.

5 Onye nzuzu na-afanye aka abụọ nʼapata,

na-eri anụ ahụ onwe ya.

6 Ọ ka mma inwe ihe ntakịrị na obi udo,

karịa mmadụ inweju akụ site nʼịdọgbu onwe ya nʼọrụ,

nke bụ naanị ịchụso ifufe.

7 Ọ dịkwa ihe ọzọ m hụrụ nʼokpuru anyanwụ bụ naanị ihe efu.

8 Ọ dị otu nwoke nke naanị ya nọ,

o nweghị nwa, o nwekwaghị ụmụnne.

Mgbe niile, ọ na-adọgbu onwe ya nʼọrụ,

ma nke a emeghị ka afọ ju ya nʼakụnụba o nwere.

Ọ jụrụ sị, "Ọ bụ nʼihi onye ka m ji adọgbu onwe m nʼọrụ,"

"nʼihi gịnị ka m ji anapụ onwe m ihe obi aṅụrị?"

Ihe nke a enweghị isi,

ihe efu na-eweta obi mgbawa ka ha bụ.

9 Mmadụ abụọ ka mma karịa otu onye,

nʼihi na ha ga-arụpụta ọtụtụ ihe:

10 Otu onye nʼime ha daa,

onye nke ọzọ ga-apalite ya.

Ma mgbe ọ bụ naanị otu onye,

onye ga-apalite ya? Ọ nọ nʼime nsogbu.

11 Ọzọ, ọ bụrụ na mmadụ abụọ edinakọ, ahụ ga-ekpokwa ha ọkụ,

ma olee otu onye naanị ya dina ga-esi nweta okpomọkụ?

12 Ọ bụ ezie na e nwere ike merie onye naanị ya guzo,

ma mmadụ abụọ pụrụ iguzo zọọ onwe ha.

Ụdọ e ji eriri atọ tụkọta nʼotu, adịghị adọbi ya ngwangwa.

Ọganihu enweghị isi

13 Ọ ka mma ịbụ nwantakịrị na onye ogbenye nwere nghọta karịa ịbụ agadi bụ eze ndị nzuzu, onye na-adịghị aṅa ntị na ndụmọdụ ọbụla. 14 Nwata dị otu a, ma eleghị anya, ọ ga-esi nʼụlọ mkpọrọ pụta bụrụ eze, ma ọ bụkwanụ na a mụrụ ya ogbenye nʼalaeze ahụ. 15 Ahụrụ m na mmadụ niile ndị bi nʼokpuru anyanwụ na-eso nwantakịrị ahụ onye nọchiri anya eze. 16 A pụghị ịgụta ndị dịnyere ya, ma ndị ga-esota nʼazụ agaghị enwe ọṅụ nʼebe onye nọchiri eze ahụ nọ. Ọzọkwa, nke a bụ ihe efu, naanị ịchụso ifufe.

Veja também

Publicidade
Eclesiastes
Ver todos os capítulos de Eclesiastes
Bíblia Online Bíblia Online

Bíblia Online • Versão: 2026-06-16_06-50-08-