Agradecimento pela família
Agradecer pela família é reconhecer a bênção mais preciosa que Deus nos concede. Os filhos são herança do Senhor — cada membro da família é presente divino a ser celebrado.
Ụmụntakịrị bụ ihe nketa si nʼaka Onyenwe anyị,
ụmụntakịrị bụ ụgwọ ọrụ ọ na-enye.
Dịka àkụ nʼaka dike nʼagha,
otu a, ka ụmụ a mụtaara na mgbe okorobịa dị.
Onye a gọziri agọzi ka nwoke ahụ bụ
onye kpojuru àkụ ndị a nʼakpa àkụ ya.
Ihere agaghị eme ha mgbe ha na ndị iro
na-arụrịta ụka nʼama.
Gọzie Onyenwe anyị
Mkpụrụobi m, too Onyenwe anyị;
ka ihe niile dị nʼime m too aha nsọ ya.
Mkpụrụobi m, too Onyenwe anyị;
echefukwala mmeso ọma ya niile,
Anyị agaghị ezonarị ụmụ anyị ihe ndị a,
kama anyị ga-akọrọ ọgbọ nke na-abịa nʼihu
akụkọ ịdị ike Onyenwe anyị,
na ọrụ ebube ya, na ihe ịtụnanya niile o mere.
Ụmụ ụmụ bụ okpueze ndị okenye.
Nne na nna bụ ịnya isi nke ụmụ ha.
Nʼihi nwa a ka m kpere ekpere, Onyenwe anyị emelara m ihe m rịọrọ nʼaka ya.
Inye ekele na ekpere
Ana m ekele Chineke m ekele mgbe ọbụla m chetara unu.
Olee ụdị ekele anyị pụrụ ikele Chineke nʼihi akụkọ nyere anyị ọṅụ nʼihu Chineke anyị nʼihi unu.
Nyenụ Onyenwe anyị, unu ezinaụlọ nke mba niile dị iche iche,
nyenụ Onyenwe anyị nsọpụrụ na ike.
Onyinye ọbụla dị mma, na nke zuruoke na-esite nʼeluigwe abịa. Ọ na-esite nʼebe Nna nke ìhè niile onye na-adịghị agbanwe agbanwe, ọ naghị ezonarị ụmụ mmadụ ihu ya.
Site nʼịba ụba nke amara ya, anyị niile anatala amara a tụkwasịrị nʼamara.
Mgbe ahụ, ndị inyom obodo ahụ bịakwutere Naomi sị ya, "Onye a gọziri agọzi ka Onyenwe anyị bụ, onye na-agbawaghị gị aka onye agbụrụ mgbapụta dị nso. Ka aha ya bụrụ ihe ga-ada ụda nʼala Izrel niile. Ya wetakwara gị ntute na ndụ gị ma bụrụkwa onye ga-azụ gị nʼisi awọ gị. Nʼihi na nwunye nwa gị, onye hụrụ gị nʼanya, onye baara gị uru karịa ndị ikom asaa, amụọrala gị nwa nwoke."
Ọ bụ ndị dị ndụ, e, naanị ndị dị ndụ ga-eto gị otuto,
dị ka m na-eme taa.
Ọ bụ otu ọgbọ na-eme ka ọgbọ na-eso ha
mata ihe banyere ikwesi ntụkwasị obi gị.