Pular para o conteúdo
Publicidade

Nehum 2

Ninive ga-ada

1 Onye na-ebuso gị agha na-abịakwasị gị.

Chee ebe gị niile e wusiri ike nche.

Chee ụzọ niile nche,

mee ka ụkwụ gị sie ike nʼala.

Chịkọtakwa ike gị niile.

2 Onyenwe anyị ga-eme ka ịma mma Jekọb laghachi,

dịka ịma mma nke Izrel

bụ ezie na ndị mbibi ebibiela ha,

lakwaa alaka osisi vaịnị ha niile nʼiyi.

3 Ọta ndị agha ya na-acha ọbara ọbara,

ndị bụ dike nʼagha yikwa uwe na-acha uhie uhie.

Igwe e ji wuo ụgbọ agha na-egbu amụma

nʼụbọchị ahụ ha na-ejikere agha,

otu a kwa, ha na-efegharịkwa ùbe ha eji osisi fịa mee.

4 Ụgbọ agha na-eme mkpọtụ dị ukwuu nʼezi,

ha na-agbagharị ihu na azụ nʼama niile.

Ha na-enwu dịka ire ọkụ,

na-agbagharịkwa dịka amụma.

5 na-akpọkọta ndị agha ya a zụziri azụzi,

ma ha na-asọ ngọngọ nʼije ha.

Ha ji ọsọ gbaga ruo nʼelu mgbidi ha,

dozie ọta nche ha niile nʼusoro.

6 Ma e megheela ọnụ ụzọ ama nke osimiri,

ụlọeze na-amakwa jijiji.

7 E nyela ya ka bụrụ iwu na obodo a

aghaghị ịbụ obodo a dọtara nʼagha.

Ndị ohu ha ndị inyom so ha nʼazụ na-akwa akwa dịka nduru,

na-etikwa aka nʼobi.

8 Ninive dịka ọdọ mmiri

nke mmiri ya na-ehifusị.

"Kwụsị! Kwụsị!" ka ha na-ebe,

ma dịghị onye ga-ele anya nʼazụ.

9 Kwakọrọnụ ọlaọcha,

kwakọrọnụ ọlaedo dịka ihe a kwatara nʼagha.

Akụnụba dị nʼụlọakụ ya na ihe ndị ọzọ bara uru nʼobodo ahụ,

enweghị ọgwụgwụ.

10 E bibiela ya. A gbahapụla ya, hapụ ya ka tọgbọrọ nʼefu.

Obi ndị nọ nʼime ya na-alọ mmiri, ikpere ha niile na-ama jijiji,

anụ ahụ ha niile na-amakwa jijiji, ihu niile achagharịakwala.

11 Ebeekwa ka ọgba ọdụm ahụ dị ugbu a,

bụ ebe ahụ ha na-anọ enye ụmụ ha nri,

ebe oke ọdụm na nne ọdụm na-ejegharị,

na ebe ụmụ ọdụm na-anọ na-atụghị egwu ihe ọbụla?

12 Ọdụm ahụ na-adọgbu anụ na-ezuru ụmụ ya,

nke na-anyagburu nne ọdụm anụ,

na-ekpoju anụ dọgbutara nʼụlọ ya niile.

Ebe obibi ya jupụtara nʼanụ dọgburu.

13 "Edoola m onwe m imegide gị,"

otu a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwubiri,

"Aga m esure ụgbọala gị niile nʼanwụrụ ọkụ,

mma agha ga-ala ụmụ ọdụm gị niile nʼiyi.

Agaghị m ahapụkwara gị anụ ọbụla ga-adọgbu nʼụwa.

A gaghị anụkwa

olu ndị ozi gị ọzọ."

Estes versículos te tocaram? Ore agora!

+581 estão orando agora.

Junte-se à corrente de oração.

Veja também

Naum
Ver todos os capítulos de Naum