Publicidade

Naum 1

1 Amụma banyere obodo Ninive. Akwụkwọ ọhụ Nehum, onye obodo Elkosh.

Iwe Onyenwe anyị megide Ninive

2 Onyenwe anyị bụ onye ekworo, bụrụkwa Chineke na-abọ ọbọ.

Onyenwe anyị na-aga ịbọ ọbọ, ọnụma jukwara ya obi.

Onyenwe anyị na-abọ ọbọ nʼahụ ndị iro ya,

oke ọnụma ya na-adịgidekwa megide ndị iro ya.

3 Onyenwe anyị adịghị ewe iwe ọsịịsọ; ma ọ bụ onye ike ya dị ukwuu,

Onyenwe anyị agaghị ahapụ onye ikpe mara ka ọ laa na-enweghị ntaramahụhụ.

Ụzọ ya dị nʼoke ikuku, na nʼoke ifufe,

igwe ojii bụ uzuzu nke ụkwụ ya.

4 Ọ na-abasiri oke osimiri mba ike, mee ka ọ taa,

o mekwaala ka osimiri niile takọrọ.

Bashan na Kamel na-akpọnwụ,

otu a kwa, nʼosisi ndụ jupụtara Lebanọn na-achanwụsị.

5 Nʼihu ya, ugwu niile na-eme mkpọtụ,

ugwu nta niile na-agbazekwa,

elu ụwa niile na-amakwa jijiji nʼihu ya,

ọ bụladị ụwa dum, na ndị niile bi nʼime ya.

6 Onye ga-eguzogide oke iwe ya?

Ọ bụkwa onye ga-eguzosi ike nʼiwe ya dị ọkụ?

A wụpụla ọnụma ya dịka ọkụ,

e tipịasịala nkume niile ndị ahụ nʼihu ya.

7 Onyenwe anyị dị mma.

Ọ bụ ebe mgbaba nʼụbọchị nsogbu.

Ọ na-elekọta ndị niile na-atụkwasị ya obi,

8 ma ọ ga-eji idee mmiri dị ukwuu

gbuo ndị iro ya niile,

ọ ga-achụba ndị iro ya nʼọchịchịrị.

9 Kedụ izu ọjọọ unu na-agba megide Onyenwe anyị

ọ ga-eweta ihe niile nʼisi njedebe;

nsogbu agaghị abịakwa nke ugboro abụọ.

10 Ha ga-abụ ndị a tụhịkọtara nʼetiti ogwu,

ndị mmanya ha ṅụbigara oke na-egbu,

ha ga-ala nʼiyi dịka ahịhịa kpọrọ nkụ.

11 Ọ bụ nʼime gị, Ninive, ka otu onye si pụta,

bụ onye ahụ gbara izu ọjọọ megide Onyenwe anyị,

na-echepụtakwa ajọ atụmatụ.

12 Ihe a ka Onyenwe anyị kwuru,

"Ọ bụ ezie na ha siri ike, ma bakwaa ụba nʼọnụọgụgụ,

ha ga-abụ ndị a ga-egbutu na ndị ga-agabiga.

Ọ bụ ezie na m ataala gị bụ Juda ahụhụ,

ma agaghị m atakwa gị ahụhụ ọzọ.

13 Ugbu a, aga m agbajipụ agbụ yoku ọ nyanyere unu nʼolu,

tibikwaa ụdọ igwe e jiri kegide unu."

14 Onyenwe anyị enyela iwu ya banyere gị, Ninive:

"Ị gaghị enwekwa ụmụ ụmụ ndị ga-aza aha gị.

Aga m ala arụsị unu niile a pịrị apị na ndị a kpụrụ akpụ nʼiyi,

bụ arụsị ndị ahụ dị nʼụlọnsọ nke chi unu niile.

Aga m akwadokwa ili gị,

nʼihi na ị bụrụla onye jọgburu onwe ya na njọ."

15 Lee, nʼelu ugwu niile

ka ụkwụ onye ahụ na-eweta oziọma dị,

bụ onye ahụ na-ekwusa na udo ga-adị!

Mee mmemme gị niile gị Juda,

mezukwaa nkwa niile i kwere.

Nʼihi na ndị ajọ omume agakwaghị ebuso gị agha,

nʼihi na a ga-ala ha nʼiyi kpamkpam.

Veja também

Publicidade
Naum
Ver todos os capítulos de Naum
Bíblia Online Bíblia Online

Bíblia Online • Versão: 2026-06-16_18-40-07-