Agradecimento pela vida
Agradecer pela vida é reconhecer que cada respiração é dom de Deus. Toda criatura que tem fôlego louve ao Senhor — porque Ele nos formou e nos sustenta com amor.
Ka ihe niile na-eku ume too Onyenwe anyị.
Toonu Onyenwe anyị.
Tụkwasị Chineke obi
Toonu Onyenwe anyị.
O mkpụrụobi m, too Onyenwe anyị.
Aga m eto Onyenwe anyị ogologo ndụ m niile;
aga m abụ abụ otuto nye Chineke m mgbe m nọ na-adị ndụ.
Ọ bụ gị kpụrụ akụkụ niile dị m nʼahụ.
Ọ bụkwa gị jikọtara ha niile ka ha bụrụ otu mmadụ nʼime afọ nne m.
Ana m eto gị nʼihi na abụ m onye e sitere nʼoke egwu na ebube kee;
ọrụ gị niile dị ebube;
amaara m nke a nke ọma.
Ụdịdị m abụghị ihe zoro ezo nʼebe ị nọ
mgbe a kpụrụ m nʼebe nzuzo ahụ,
mgbe a kpakọtara m nʼebe omimi nke ụwa.
Anya gị abụọ hụrụ ahụ m mgbe ọ na-enweghị ụdịdị ọbụla.
E dere ụbọchị niile a kwadoro m nʼime akwụkwọ gị
tupu otu nʼime ha adịrị.
Aga m abụku Onyenwe anyị abụ ogologo ụbọchị niile nke ndụ m;
aga m abụku Chineke m abụ otuto oge niile m na-adị ndụ.
Ka ntụgharị uche m niile bụrụ ihe na-atọ ya ụtọ,
dịka m na-aṅụrị ọṅụ nʼime Onyenwe anyị.
Matanụ na Onyenwe anyị bụ Chineke.
Ọ bụ ya onwe ya kere anyị, ọ bụkwa ya nwe anyị,
anyị bụ ndị ya, igwe atụrụ nke ọ na-azụ.
Jirinụ ekele banye nʼọnụ ụzọ ama ya
jiri otuto baa nʼogige ya;
keleenụ ya, tookwa aha ya.
Lee ka ịhụnanya gị nke na-adịghị agwụ agwụ si dị oke ọnụahịa, O Chineke!
Ụmụ mmadụ na-agbaba nʼokpuru ndo nke nku gị abụọ.
Ha na-eri oriri site nʼịba ụba nke ụlọakụ gị;
Ị na-enyekwa ha mmiri site nʼiyi nke obi ụtọ gị.
Nʼihi na mmiri na-enye ndụ dị na gị;
ọ bụkwa nʼìhè gị ka anyị na-ahụ ìhè.
Abụ mgbapụta
Aga m eto gị, O Onyenwe anyị,
nʼihi na i sitere nʼebe dị omimi dọpụta m.
I kweghị ka ndị iro m chịa m ọchị.
O Onyenwe anyị Chineke m, akpọkuru m gị, ka i nyere m aka,
ị gwọkwara m.
O Onyenwe anyị, i si nʼala ili kpọpụta m,
i mere ka m dịrị ndụ.
Ekele nʼihi nnapụta Chineke
O Onyenwe anyị, aga m esite nʼala ala obi m too gị,
aga m agwakwa onye ọbụla ihe ọma niile ị na-eme.
Obi ga-atọ m ụtọ; obi m ga-ejupụta nʼọṅụ nʼihi gị,
aga m abụrụ gị abụ otuto, gị Onye kachasị ihe niile elu.
Na-enyenụ Chineke bụ Nna ekele mgbe niile na nʼihe niile, nʼaha Onyenwe anyị Jisọs Kraịst.
Ngọzị dịrị anyị nʼime Kraịst
Ka otuto dịrị Chineke, na Nna Onyenwe anyị Jisọs Kraịst, bụ onye gọziri anyị site nʼinye anyị ngọzị niile nke ime mmụọ nke si nʼebe niile nke eluigwe nʼime Kraịst.
Ekele dịrị Chineke nʼihi onyinye ya dị ukwuu nke ọnụ na-apụghị ịkọ.
na-enyenụ Nna ekele site nʼọṅụ, onye mere ka anyị kwesi iketa oke nʼihe nketa nke ndị nsọ nʼime alaeze nke ìhè. Nʼihi na ọ napụtara anyị site nʼike nke ọchịchịrị, bịa kpọfee anyị nʼalaeze nke Ọkpara ya ọ hụrụ nʼanya. Onye anyị si nʼime ya nwee nzọpụta, nke bụ mgbaghara mmehie niile.
Onye Kraịst bụ, na ihe o mere
Ọ bụ nnọọ onyinyo Chineke onye anyị na-apụghị ịhụ anya, bụrụkwa onye mbụ a mụrụ nʼihe niile e kere eke. Nʼihi na nʼime ya ka e ji kee ihe niile dị nʼụwa na nke dị nʼeluigwe, na ndị anyị pụrụ ịhụ anya na ndị anyị na-apụghị ịhụ anya, ma ocheeze niile, ike niile, ịchị isi niile na ike ọchịchị niile. E kere ihe niile site nʼaka ya nakwa nʼihi ya. Ya onwe ya nọ tupu ekee ihe niile, ọ bụkwa nʼime ya ka ejikọtara ihe niile nʼotu.
Mgbe i riri rijuo afọ, too Onyenwe anyị Chineke gị nʼihi ala mara mma nke o nyere gị.
Gị onwe gị, Onyenwe anyị, kpechitere ọnụ m,
gị gbapụtara ndụ m.
Arịdaruola m nʼala ugwu ugwu nke osimiri,
ala ahụ ihe ntụchi ya niile kpachitara m ruo mgbe ebighị ebi.
Ma i meela ka m si nʼolulu pụta na ndụ,
Onyenwe anyị, bụ Chineke m.
"Mgbe mmụọ m na-ada mba nʼike nʼike,
e chetara m gị Onyenwe anyị,
ma ekpere m bịakwutere gị,
nʼime ụlọnsọ ukwu gị dị nsọ.