Pular para o conteúdo
Publicidade

Salmos 100

Abụ Ọma maka ikele ekele afọ ojuju.

Toonu Chineke

1 Tikusienụ Onyenwe anyị mkpu ọṅụ ike, ụwa niile.

2 Jiri obi ụtọ fee Onyenwe anyị ofufe;

jirinụ ịbụ abụ ọṅụ bịa nʼihu ya

3 Matanụ na Onyenwe anyị bụ Chineke.

bụ ya onwe ya kere anyị,100:3 Job 10:3; Efe 2:10 bụkwa ya nwe anyị,

anyị bụ ndị ya, igwe atụrụ nke na-azụ.

4 Jirinụ ekele banye nʼọnụ ụzọ ama ya

jiri otuto baa nʼogige ya;

keleenụ ya, tookwa aha ya.

5 Nʼihi na Onyenwe anyị dị mma, ịhụnanya ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi.

Ruo ọgbọ niile ka ikwesi ntụkwasị obi ya na-adịgidekwa.

Veja também