Publicidade

Provérbios 18

1 Onye ihe mmadụ na-adịghị amasị na-agbaso naanị ọchịchọ nke ya onwe ya,

na-alụsokwa ezi nzube niile ọzọ ọgụ.

2 Nghọta adịghị atọ onye nzuzu ụtọ.

Naanị ihe ọ maara bụ ikwu uche ya.

3 Mgbe onye ajọ omume na-abata, ka nleda anya na-abata,

otu a kwa nkọcha na-eweta ihere.

4 Okwu ọnụ niile bụ mmiri dị omimi,

ma amamihe dị ka mmiri iyi na-asọ asọ.

5 Ọ dịghị mma ime ka ikpe gara onye mere ihe ọjọọ,

si otu a gbochie onye aka ya dị ọcha inweta ikpe ziri ezi.

6 Egbugbere ọnụ ndị nzuzu na-ebutere ha esemokwu,

ọnụ ha na-ebutere ha ihe otiti.

7 Ọnụ onye nzuzu na-etinye ya na nsogbu,

egbugbere ọnụ ya bụ ọnya nye mkpụrụobi ya.

8 Okwu niile nke onye na-agba asịrị na-ekwu dịka iberibe nri nʼatọ ezi ụtọ,

ha na-agbadakwa nʼime ime ala afọ.

9 Onye dị umengwụ nʼọrụ ya

bụ nwanne nke onye mbibi.

10 Aha Onyenwe anyị bụ ụlọ elu e wusiri ike,

ndị ezi omume na-agbaba nʼime ya izere ndụ.

11 Akụ ndị ọgaranya bụrụ ha obodo e wusiri ike,

ọ bụkwa mgbidi dị elu nke a na-apụghị ịmafe nʼechiche ha.

12 Tupu mmadụ adaa obi ya na-ejupụta na nganga,

ma inwe obi umeala na-eweta nsọpụrụ.

13 Inye ọsịsa okwu tupu mmadụ ege ntị

bụ enweghị uche na ihe ihere.

14 Ọ bụ mmụọ mmadụ na-akwado ya nʼoge nrịa nrịa,

ma mmụọ e tipịara etipịa, onye pụrụ ibuli ya?

15 Obi onye nwere nghọta na-enweta ihe ọmụma,

nʼihi na ntị onye maara ihe na-achọpụta ya.

16 Onyinye mmadụ na-akwara ya ụzọ sara mbara,

ọ na-edubakwa ya nʼihu ndị dị elu.

17 Nʼikpe onye buru ụzọ kwuo ihe na-ese na-adị ka onye ikpe gaara,

tutu ruo mgbe mmadụ bịara bido ịjụ ya ajụjụ.

18 Ife nza na-akwụsị esemokwu na ndọrọndọrọ

dị nʼetiti mmadụ abụọ ndị olu ha na-ala elu.

19 Ọ dị mfe ịlụgbụ obodo karịa ime ka obi nwanne e mehiere tụgharịa.

Iwe ya na-adị ike dịka ọnụ ụzọ e jiri igodo tụchie.

20 Site na mkpụrụ nke okwu ọnụ mmadụ mịpụtara ka afọ ga-eji ju ya.

Sitekwa nʼihe owuwe ubi nke egbugbere ọnụ ha ka ha ga-eji rijuo afọ.

21 Ike ọnwụ na ndụ dị ire nʼaka.

Ndị hụrụ ya nʼanya ga-eri mkpụrụ ya.

22 Nwoke ahụ chọtara nwunye chọtara ezi ihe.

Ọ na-anatakwa ihuọma site nʼaka Onyenwe anyị.

23 Onye ogbenye na-arịọ arịrịọ maka ebere;

ma ọgaranya na-asa okwu ike ike.

24 Onye nwere ọtụtụ ndị enyi ndị na-ekwesighị ga-abịa nʼịla nʼiyi mgbe na-adịghị anya,

ma ọ dị enyi nke na-arapara nso karịa nwanne.

Veja também

Publicidade
Bíblia Online Bíblia Online

Bíblia Online • Versão: 2026-06-16_18-40-07-