Publicidade

Provérbios 3

Amamihe na-eweta ahụ ike

1 Nwa m echezọla ihe niile m ziri gị.

Ma debe iwu m nʼobi gị.

2 Nʼihi na ha ga-eme ka ndụ gị dị ogologo ruo ọtụtụ afọ,

wetakwara gị udo na ọganihu.

3 Ekwela ka ịhụnanya na ikwesi ntụkwasị obi hapụ gị,

kekwasị ha nʼolu gị,

deekwa ha nʼelu mbadamba nkume, bụ obi gị.

4 Mgbe ahụ, ị ga-enwe ihuọma na ezi aha

nʼanya Chineke na nʼihu mmadụ.

5 Tụkwasị Onyenwe anyị obi gị niile,

adaberekwala na nghọta gị.

6 Nʼihe ọbụla ị na-eme, ka Chineke bute ụzọ,

ọ ga-eduzi gị, meekwa ka okporoụzọ gị niile gazie.

7 A bụla onye maara ihe nʼanya nke onwe gị.

Tụọ Onyenwe anyị egwu, kpọọkwa ihe ọjọọ asị.

8 Nke a ga-eme ka i nwee ahụ ike

gbaakwa ọkpụkpụ gị ume.

9 Sọpụrụ Onyenwe anyị site nʼinye ya mkpụrụ mbụ nke akụnụba gị,

na mkpụrụ mbụ nke ihe ubi gị.

10 Mgbe ahụ ka ọ ga-eme ka ọba gị niile jubigakwa oke,

ebe ịnara mmanya gị ga-ejupụta na mmanya ọhụrụ.

11 Nwa m nwoke ajụla ịdọ aka na ntị nke Onyenwe anyị,

ike agwụla gị ịnagide ịba mba ya.

12 Nʼihi na ọ bụ ndị Onyenwe anyị hụrụ nʼanya ka ọ na-abara mba,

dịka nna si abara nwa ya nke ihe ya na-atọ ya ụtọ mba.

13 Onye a gọziri agọzi ka mmadụ ahụ bụ onye chọtara amamihe,

onye nwetara nghọta.

14 Nʼihi na amamihe dị mma karịa ọlaọcha,

ọ bakwara uru karịa ọlaedo.

15 Ọ dị oke ọnụahịa karịa ọla rubi,

ọ dịghị ihe na-amasị gị e ji atụnyere ya.

16 Ndụ ogologo dị nʼaka nri ya;

nʼaka ekpe ya ka akụnụba na nsọpụrụ dịkwa.

17 Ụzọ ya bụ ụzọ dị mma

bụrụkwa ụzọ udo.

18 Amamihe bụ osisi nke ndụ nye ndị na-ejide ya aka,

e, onye ahụ nke na-ejidesi ya aka ike ka ihe na-agara nke ọma.

19 Ọ bụ site nʼamamihe ka Onyenwe anyị ji tọọ ntọala ụwa;

ọ bụkwa nghọta ya mere ka eluigwe dịrị ebe ọ dị.

20 Esitere nʼihe ọmụma ya kewaa ogbu mmiri niile,

igwe ojii na-atụdakwa igirigi.

21 Nwa m nwoke, ekwela ka ihe abụọ ndị a site nʼihu gị wezuga onwe ha:

amamihe na nghọta nke ime ihe dị mma nʼizuzu zuruoke,

22 nʼihi na ha na-enye gị ndụ ọhụrụ,

ha bụkwaara gị ihe ịchọ mma amara nʼolu gị.

23 Ha na-eme ka ị na-aga ije nʼụzọ gị na-enweghị ihe egwu

maọbụ ihe mkpọbi ụkwụ.

24 Mgbe ị ga-edina ala, ị gaghị atụ egwu,

ị ga-edina ala ụra gị ga-adị ụtọ.

25 Ị gaghị atụ egwu ihe mbibi mberede ọbụla

maọbụ tụọ egwu ịla nʼiyi nke na-abịakwasị ndị ajọ omume.

26 Nʼihi na Onyenwe anyị bụ ebe ndabere gị,

ọ ga-echebekwa gị.

27 Ejigidele ihe ọma ị pụrụ imere onye ọzọ

mgbe ọ dị gị nʼaka ime ya.

28 A sịkwala onye agbataobi gị laa,

bịaghachi azụ echi

mgbe i nwere ike ime ya taa.

29 Agbala izu ọjọọ megide onye agbataobi gị,

nʼihi na o nwere ntụkwasị obi nʼebe ị nọ.

30 Ebola mmadụ ebubo na-enweghị isi,

mgbe onye ahụ na-emeghị gị ihe ọjọọ ọbụla.

31 Ekwosola onye na-eme ihe ike ekworo

maọbụ họrọ ụzọ ya ọbụla.

32 Nʼihi na ndị dị otu a bụ ihe arụ nʼanya Onyenwe anyị,

ma ọ na-emeso ndị na-eme ihe ziri ezi mmeso ọma.

33 Ọbụbụ ọnụ Onyenwe anyị dị nʼụlọ ndị na-eme ajọ omume,

ma ọ na-agọzi ụlọ ndị ezi omume.

34 Ndị mpako na-akwa emo ka ya onwe ya na-akwakwa emo,

ma ndị dị umeala nʼobi ka ọ na-enye amara.

35 Ndị maara ihe na-enweta nsọpụrụ,

ma ndị nzuzu na-enweta ihere.

Veja também

Publicidade
Bíblia Online Bíblia Online

Bíblia Online • Versão: 2026-06-16_18-40-07-