Publicidade

Provérbios 12

1 Onye ọbụla na-ahụ ịdọ aka na ntị nʼanya na-ahụ ihe ọmụma nʼanya,

ma onye na-akpọ ịba mba asị bụ onye na-enweghị ụbụrụ isi.

2 Ezi mmadụ na-anata ihuọma site nʼaka Onyenwe anyị,

ma onye na-atụpụta atụmatụ ọjọọ ka ọ na-ama ikpe.

3 Onye ajọ omume agaghị anọgide,

ma apụghị ihopu onye ezi omume.

4 Ezi nwanyị bụ ọṅụ na okpueze di ya,

ma nwanyị na-eweta ihere dịka ire ure nʼọkpụkpụ di ya.

5 Echiche obi niile nke onye ezi omume bụ ihe ziri ezi,

ma ndụmọdụ onye ajọ omume jupụtara nʼaghụghọ.

6 Okwu niile nke ndị ajọ omume bụ ihe na-eweta ọnwụ,

ma okwu ndị omume ha ziri ezi na-anapụta ha.

7 Ndị na-emebi iwu ga-ala nʼiyi,

ma ndị ezi omume ga-eguzosi ike.

8 Onye nwere uche zuruoke ka mmadụ niile na-achọ,

ma onye uche ya gbagọrọ agbagọ ka mmadụ na-eleda anya.

9 Ọ ka mma ịbụ onye a na-elelị anya ma i nwere ohu,

karịa ịbụ onye a na-asọpụrụ ma bụrụ onye nri na-adịghị nʼụlọ ya.

10 Onye ezi omume na-elekọta anụ ụlọ ya,

ma obi ebere kachasị nro nke onye ajọ omume mere bụ enweghị obi ebere.

11 Onye na-arụ ala ubi ya ga-enwe nri nʼebe ọ bara ụba,

ma onye na-agbaso ihe efu dị iche iche, amamihe kọrọ.

12 Ndị ajọ omume na-enwekwa anya ukwu nʼihe ndị ajọ omume ibe ha nwere,

ma mgbọrọgwụ nke ndị ezi omume ga-eto eto.

13 A na-ejide onye ajọ omume site nʼokwu ọnụ ya,

ma onye ezi omume na-esi na nsogbu wezuga onwe ya.

14 Ikwu eziokwu na-enye mmadụ obi ụtọ,

inwe mgbalị na-ewetara ya ngọzị.

15 Ụzọ ndị nzuzu nʼuche ha onwe ha ziri ezi,

ma onye maara ihe na-aṅa ntị nye ndụmọdụ.

16 Ndị nzuzu na-egosipụta iwe ha ọsịịsọ,

ma onye nwere uche na-elepụrụ mkparị anya.

17 Ezi onye akaebe na-ekwu eziokwu,

ma ajọ onye akaebe na-ekwu okwu ụgha.

18 Okwu ọjọọ na-agbawa obi dịka mma agha,

ma ire onye maara ihe na-eweta ọgwụgwọ.

19 Eziokwu na-eguzo ruo mgbe ebighị ebi,

ma okwu ụgha anaghị adịgide.

20 Aghụghọ na-ejupụta nʼobi na-eche ihe ọjọọ;

ma ndị na-eme ka udo dị na-enwe ọṅụ.

21 Ihe ọjọọ anaghị adakwasị onye ezi omume,

ma ndị ajọ omume enwetala nsogbu ebe ọ dị ukwuu.

22 Onyenwe anyị kpọrọ egbugbere ọnụ nʼagha ụgha asị,

ma ihe ndị kwesiri ntụkwasị obi na-amasị ya.

23 Onye nwere uche na-edebe ihe ọmụma ha nye onwe ha,

ma onye nzuzu na-agbasa enweghị uche ya nʼanwụ.

24 Aka na-arụsị ọrụ ike ga-achị achị,

ma umengwụ ga-akwụsị naanị nʼọrụ mmanye.

25 Obi nke jupụtara na nchegbu na-ada mba,

ma okwu ọma na-eme ka obi ṅụrịa.

26 Onye ezi omume na-eduzi onye agbataobi ya,

ma onye na-emebi iwu na-eduhie ha.

27 Onye umengwụ adịghị ahụ anụ ọ chụtara na nta nʼọkụ,

ma ndị na-arụsị ọrụ ike na-eri site nʼakụ ha nwetara nʼịchụ nta.

28 Ụzọ nke onye ezi omume na-eduba na ndụ,

nʼụzọ ahụ, ọnwụ adịghị ya.

Veja também

Publicidade
Bíblia Online Bíblia Online

Bíblia Online • Versão: 2026-06-15_21-32-39-