Publicidade

Provérbios 21

1 Iyi dị iche iche nke jupụtara na mmiri ka obi eze bụ nʼaka Onyenwe anyị,

nke ọ na-ahazi nʼụzọ ọbụla dị ya mma.

2 Ọrụ niile bụ ihe ziri ezi nʼanya onye na-arụ ya,

ma Onyenwe anyị bụ onye na-eleba anya nʼechiche obi anyị niile.

3 Ime ezi omume na ihe ziri ezi

ka Onyenwe anyị na-anabata karịa ịchụ aja.

4 Nganga na mpako na agụụ ihe ọjọọ

nke bụ ọrụ ndị ajọ omume, bụ mmehie.

5 Echiche niile nke onye na-arụsị ọrụ ike na-eweta uru,

dịka echiche onye ome ngwangwa na-enweta naanị ụkọ.

6 Uru niile enwetara nʼụzọ na-ezighị ezi adịghị adịgide,

ha bụ nkuume ifufe na-efesa, ndị na-achọ ya na-achọ ọnwụ.

7 Nʼihi na ndị na-emebi iwu anaghị eme ihe ọma,

ihe ọjọọ ha na-eme na-alaghachi laa ha nʼiyi.

8 Ụzọ onye na-emebi iwu bụ ihe gbagọrọ agbagọ,

ma omume onye aka ya dị ọcha ziri ezi.

9 Ọ ka mma ibi nʼotu akụkụ elu ụlọ

karịa ibinyere nwanyị na-ese okwu.

10 Ihe na-atọ onye ọjọọ ụtọ bụ imerụ ndị ọzọ ahụ;

ọ maghị imere mmadụ ibe ya ebere.

11 Mgbe a na-ata onye na-akwa emo ahụhụ, onye na-enweghị uche na-enweta amamihe,

ma mgbe a na-akụziri onye maara ihe ihe ọ na-enweta ihe ọmụma.

12 Onye ezi omume na-amụta ihe site nʼile ụlọ onye ajọ omume anya

na-emekwa ka ndị ajọ omume laa nʼiyi.

13 Onye na-adịghị ege ntị na mkpu onye ogbenye,

ya onwe ya ga-akpọkwa mkpu ma agaghị aza ya.

14 Onyinye enyere na nzuzo na-eme ka iwe dajụọ,

otu a kwa, ngarị ezonyere nʼime uwe na-eme ka oke ọnụma dajụọ.

15 Onye ezi omume na-aṅụrị ọṅụ mgbe e kpere ikpe ziri ezi,

ma bụrụ ihe oke egwu dịrị ndị na-eme ajọ ihe.

16 Onye ọbụla si nʼụzọ nghọta wezuga onwe ya

ga-eso nʼotu ndị nwụrụ anwụ.

17 Nwoke hụrụ ibi ndụ nganga nʼanya na-ada ụkpa;

ịṅụ mmanya na oke oriri abụghị ụzọ esi akpata akụ.

18 Onye ajọ omume ga-abụ ihe mgbapụta maka onye ezi omume,

onye aghụghọ ga-abụkwa ihe mgbapụta maka onye ndụ ya ziri ezi.

19 Ọ ka mma ibi nʼọzara

karịa ibinyere nwanyị na-atamu ntamu na-esekwa okwu.

20 Onye maara ihe na-edebe ezi ihe oriri na mmanụ oliv nʼụlọ ya,

ma onye nzuzu na-eloda ihe niile nʼọnụ ya.

21 Onye na-achụso ezi omume na ịhụnanya

ga-achọta ndụ, na ugwu na ọganihu.

22 Onye maara ihe nwere ike megide obodo ndị dike,

kwatuokwa ebe ewusiri ike nke ha tụkwasịrị obi ha.

23 Onye na-echekwa ire ya na ọnụ ya

na-egbochiri onwe ya ọdachi.

24 Onye nganga na onye mpako, onye na-akwa emo bụ aha ya.

Ọ na-eji oke nganga eme ihe niile.

25 Oke ọchịchọ nke onye umengwụ na-ewetara ya ọnwụ

nʼihi na ọ jụrụ ịrụ ọrụ.

26 Kwa ụbọchị ka ọ na-achọ inwe karịa,

ma onye ezi omume na-enye na-akpaghị oke.

27 Chineke kpọrọ aja ndị na-emebi iwu asị,

nke ka nke, ma ọ bụrụ na ha na-enye onyinye a site na nzube ọjọọ.

28 Onyeama ụgha ga-ala nʼiyi,

ma onye ọbụla na-ege ya ntị ka a ga-ebibi ruo ebighị ebi.

29 Ndị ajọ omume na-ebi ndụ atụghị egwu,

ma ndị omume ha ziri ezi na-atụgharị uche nʼụzọ ha niile.

30 O nweghị amamihe dị, o nweghị nghọta dị, o nwekwaghị atụmatụ ọbụla,

nke pụrụ iguzosi ike megide Onyenwe anyị.

31 E nwere ike jikere ịnyịnya, kwadokwaa maka agha,

maọbụ naanị Onyenwe anyị na-enye mmeri.

Veja também

Publicidade
Bíblia Online Bíblia Online

Bíblia Online • Versão: 2026-06-16_18-40-07-