Publicidade

Provérbios 2

Ịba uru nke amamihe

1 Nwa m, ọ bụrụ na ị nabata okwu ọnụ m niile

zobekwa iwu m niile nʼime obi gị,

2 tọọ ntị gị nʼala nye amamihe,

wepụta obi gị inwe nghọta.

3 E, ọ bụrụ na ọ bụ ihe ọmụma ka ị na-akpọku,

ọ bụrụkwa na ọ bụ nghọta ka ị na-eweliri olu gị,

4 ọ bụrụ na ị na-achọ ya dịka i si achọ ọlaọcha

maọbụ akụ nke zoro ezo,

5 mgbe ahụ, ị ga-aghọtakwa ihe bụ ịtụ egwu Onyenwe anyị

chọtakwa ihe ọmụma nke Chineke.

6 Nʼihi na ọ bụ Onyenwe anyị na-enye amamihe;

nʼebe ọ nọ ka nghọta na ihe ọmụma na-esi abịa.

7 Ọ na-edebere ndị ụzọ ha ziri ezi nzube ọganihu,

ọ bụ ọta nye ndị na-eje ije nʼizuoke.

8 Ọ na-echebekwa ụzọ nke ndị na-eme ezi ihe na-agbaso,

na-elekọtakwa ụzọ nke ndị hụrụ ya nʼanya na-agbaso.

9 Mgbe ahụ ka ị ga-aghọta ihe ziri ezi

na ihe dị mma na ezi ụzọ niile.

10 Nʼihi na amamihe ga-enwe ọnọdụ nʼime obi gị,

ihe ọmụma ga-adịkwa mkpụrụobi gị ụtọ.

11 Izuzu zuruoke ga-echebe gị,

nghọta ga na-eche gị nche.

12 Amamihe ga-azọpụta gị site nʼụzọ ndị mmehie,

sitekwa na mmadụ ndị okwu ha jọrọ njọ,

13 ndị hapụrụ ụzọ niile ziri ezi nke Chineke

na-agbaso ụzọ niile nke ọchịchịrị,

14 ndị na-aṅụrị ọṅụ nʼihe ọjọọ,

nʼihi na mmehie ha na-atọ ha ụtọ.

15 Ihe ọbụla ha na-eme gbagọrọ agbagọ,

jọọkwa njọ.

16 Ọ bụ naanị amamihe ga-anapụta gị nʼaka nwanyị akwụna,

na nwanyị na-abụghị nwunye gị nke na-ekwu okwu nrafu.

17 Onye na-ahapụ di ọ lụrụ nʼagbọghọ,

nke chefuru ọgbụgba ndụ ọ gbara nʼihu Chineke.

18 Ụlọ nwanyị dị otu a dị nʼokporoụzọ

nke na-eduba nʼọnwụ na nʼọkụ ala mmụọ.

19 Ndị ikom niile banyere nʼụlọ ha na-ala nʼiyi.

Ha adịghị alọtakwa nʼokporoụzọ nke na-eduba na ndụ.

20 Nʼihi nke a, ị ga-aga ije nʼụzọ ndị ezi omume,

debekwa ụkwụ gị nʼokporoụzọ niile nke ndị ezi omume,

21 nʼihi na ọ bụ naanị ndị ziri ezi ga-ebi nʼala ahụ,

ndị na-enweghị ịta ụta ga-afọdụkwa nʼime ya.

22 Ma ndị na-emebi iwu ka a ga-ebipụ site nʼala ahụ,

ọ bụkwa ndị na-ekwesighị ntụkwasị obi ka a ga-ewezuga na ya.

Veja também

Publicidade
Bíblia Online Bíblia Online

Bíblia Online • Versão: 2026-06-15_21-32-39-