Publicidade

Provérbios 17

1 Ọ ka mma ịta iberibe achịcha kpọrọ nkụ ma ịnọ nʼudo adị ya,

karịa nʼụlọ jupụtara nʼoke oriri na ịlụ ọgụ.

2 Ohu nwere uche ga-achị nwa nna ya ukwu na-eweta ihere

ma ketakwa oke nʼihe nketa dịka otu nʼime ndị ezinaụlọ ahụ.

3 Ite eji anụcha ihe dịrị ọlaọcha, oke ọkụ dịkwara ọlaedo

ma Onyenwe anyị na-anwale obi.

4 Ajọ mmadụ na-aṅa ntị nʼegbugbere ọnụ na-eduhie,

onye ụgha na-aṅakwa ntị nye ire na-ekwu okwu ịla nʼiyi.

5 Onye ọbụla na-akwa ogbenye emo ọ bụ Chineke kere ha ka ọ na-elelị anya.

Ndị niile na-aṅụrị ọṅụ nʼihi ihe ike dakwasịrị ha aghaghị ịta ahụhụ.

6 Ụmụ ụmụ bụ okpueze ndị okenye.

Nne na nna bụ ịnya isi nke ụmụ ha.

7 Egbugbere ọnụ na-ekwu okwu dị mma abụghị nke onye nzuzu,

otu a kwa, egbugbere ọnụ na-agha ụgha ekwesighị ịbụ nke onye na-achị achị.

8 Nʼanya onye na-enye ngarị ọ na-ahụta ya dịka ọgwụ ịrata mmadụ,

ha na-eche nʼebe ọbụla ha chere ihu ihe ga-aga nke ọma.

9 Onye ọbụla na-akwado ịhụnanya na-ekpuchi njehie,

ma onye na-ekwu ihe mere mgbe na mgbe na-ekewa ezi enyi.

10 Ịba mba ntakịrị a baara onye nwere nghọta bara uru

karịa narị ụtarị nke a pịara onye nzuzu.

11 Onye ọjọọ na-ebi naanị ndụ nnupu isi megide Chineke.

Ọ bụkwa onyeozi nke ọnwụ ka a ga-eziga imegide ya.

12 Ọ ka mma izute nne Bịa a napụrụ ụmụ ya

karịa izute onye nzuzu uche ya gbagọrọ agbagọ.

13 Ọ bụrụ na i jiri ihe ọjọọ kwụọ ụgwọ ihe ọma,

ọbụbụ ọnụ dịrị ezinaụlọ gị.

14 Esemokwu malite ọ na-esi ike imedo ya,

nʼihi ya ekwela ka ọ malite.

15 Onye na-asị onye ikpe maara na ikpe amaghị ya na-amakwa onye aka ya dị ọcha ikpe,

Onyenwe anyị na-akpọ omume abụọ a asị.

16 Uru gịnị ka ego bara nʼaka onye nzuzu;

ebe ọ bụ na o nweghị ike ịchọ amamihe.

17 Ezi enyi na-egosi ịhụnanya ya nʼoge ọbụla.

Otu a kwa, nwanne na-aba uru nʼoge mkpa.

18 Ọ bụ uche ezughị oke ịnara ụgwọ onye ọzọ ji,

si otu a ghọọ onye ji ụgwọ.

19 Onye na-ahụ esemokwu nʼanya hụrụ mmehie nʼanya.

Onye na-ewuli ọnụ ụzọ ama ya elu na-akpọ ntipịa oku.

20 Ọ dịghị aga nʼihu bụ onye obi ya gbagọrọ agbagọ.

Onye nwere ire nrafu ga-adanye na nsogbu.

21 Ọ bụ naanị iru ụjụ na obi ọjọọ

dịịrị nna nke nwa ya na-eme ihe nzuzu.

22 Obi nke na-aṅụrị ọṅụ na-eme ka ahụ sie ike,

ma mmụọ na-eru ụjụ oge niile na-akpata ọrịa.

23 Onye ajọ omume na-anara ihe ngarị na nzuzo

ka ọ sụgharịa ikpe ziri ezi isi.

24 Onye nwere nghọta na-eche uche amamihe nʼihe ọ na-eme,

ma anya onye nzuzu na-elegharị ruo na nsọtụ nke ụwa.

25 Nwa dị nzuzu na-ewetara nna ya mwute,

bụrụkwa nne mụrụ ya ihe ilu.

26 Ọ bụrụ na ịra onye ezi omume nra adịghị mma,

nʼezie, ịpịa ndị ọrụ ihe nʼihi ezi ọrụ ha ezighị ezi.

27 Nwoke ahụ na-adịghị ekwu ọtụtụ okwu bụ onye maara ihe,

onye mmụọ ya dịkwa jụụ bụ onye nwere nghọta.

28 A ga-agụ onye nzuzu nʼonye maara ihe ma ọ bụrụ na ha gba nkịtị,

gụọkwa ha na ndị nwere nghọta ma ọ bụrụ na ha e jide ire ha.

Veja também

Publicidade
Bíblia Online Bíblia Online

Bíblia Online • Versão: 2026-06-16_18-40-07-